Full Lyrics
INTRO
Chineke goziri m agozi, onye mere m'ihe ọnụ si m goribe.
Ụwa nile, kelenu Ya! Toonu Chukwu, n'ihi na Chineke n'e mere m'ihe dị mma.
CHORUS
Eh! bíanụ lee onyinye Chineke na ndụ m bar'ụba.
M'ọdị mma, m'ọdị njọ; ọdị m mma m'odiraá Chukwu mma!
Odiraá Chukwu mma: ọdị m mma m'odiraá Chukwu mma!
VERSE 1
Ihe m yọrọ Chukwu, O nyerem m'O nyeghị m;
ọdị m mma m'odiraá Chukwu mma!
Ekpere m nile, O zaram m'O zaghị m;
ọdị m mma m'odiraá Chukwu mma!
BRIDGE
Ekwerem ekwe nezie, onye chekwubere na Chukwu adịghị a gb'aka laa!
Ọkaka, nar'ekele, Odogwu; a na m ekele!
VERSE 2
Akaraaka m dị etu o si masị Chineke;
ọdị m mma m'odiraá Chukwu mma!
Ọnọdụ m nile bụ otu o si bụr'uche Chineke;
ọdị m mma m'odiraá Chukwu mma!