Full Lyrics
[REFRAIN]
Eh! Obiligo! Eh! Obiligo!
Kristi emerig'ọnwụ!
Omerigo!
K'anyị ṅụrịbanụ, butenụ egwuọma, n'opi ike.
Kristi Dinwen'anyị
Omerigo!
Ik'ekwensu asago mba!
Nmeri Chi m'ezie,
guzorogo! Nwa Chineke
Omerigo!
[VERSE 1]
Na Gesthamani Kristi ruruju
Ọsịsọ nmee nile Omerigo!
Okpu ogwu! Ụtarị a pịara Ya,
[VERSE 2]
Akpọgbue Ya n'obe, Omerigo!
N'ụzụtụtụ mgbe anwụ walụ n'ụbọchị nk'atọ.
Ụmụ nwaanyị gara n'ili chọọ Y'ebe nile,
mana h'ahụghị Ya.
Ha chọrọ Y'elu chọọ Ya n'ala;
chọọ Ya n'ugwu, chọọ Ya na ndịda;
chọọ Y'ebe nile, mana h'ahụghị Ya.
[VERSE 3]
Otu Mmụọzi kwuru n'ụzọ wee sị ha,
Ṅụrịbanụ! Kristi Dinwen'unu ebiligo!
Ọ burug'un'ụzọ gaba na Galilee,
[VERSE 4]
Gabanụ gagw'ụmụazụ Ya n'obiligo!
Aka nri Chukwu emeriela.
Aka nri Y'eweliela m'elu.
Ọnwụ olee ike gị?
Ili olee nmeri gị?
Omerigo!