OBILIGO! (Easter) by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Easter Hymns Entrance songs Recessional / Dismissal Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Eh! Obiligo! Eh! Obiligo! Kristi emerig'ọnwụ! Omerigo! K'anyị ṅụrịbanụ, butenụ egwuọma, n'opi ike. Kristi Dinwen'anyị Omerigo! Ik'ekwensu asago mba! Nmeri Chi m'ezie, guzorogo! Nwa Chineke Omerigo! [VERSE 1] Na Gesthamani Kristi ruruju Ọsịsọ nmee nile Omerigo! Okpu ogwu! Ụtarị a pịara Ya, [VERSE 2] Akpọgbue Ya n'obe, Omerigo! N'ụzụtụtụ mgbe anwụ walụ n'ụbọchị nk'atọ. Ụmụ nwaanyị gara n'ili chọọ Y'ebe nile, mana h'ahụghị Ya. Ha chọrọ Y'elu chọọ Ya n'ala; chọọ Ya n'ugwu, chọọ Ya na ndịda; chọọ Y'ebe nile, mana h'ahụghị Ya. [VERSE 3] Otu Mmụọzi kwuru n'ụzọ wee sị ha, Ṅụrịbanụ! Kristi Dinwen'unu ebiligo! Ọ burug'un'ụzọ gaba na Galilee, [VERSE 4] Gabanụ gagw'ụmụazụ Ya n'obiligo! Aka nri Chukwu emeriela. Aka nri Y'eweliela m'elu. Ọnwụ olee ike gị? Ili olee nmeri gị? Omerigo!

Download the sheet music

OBILIGO! (Easter)

OBILIGO! (Easter)

By Jude Nnam
Staff & Solfa
Igbo
9 pages
3 Downloads
Easter Hymns Entrance songs Recessional / Dismissal Hymns
0 0

More lyrics you may want