Full Lyrics
REFRAIN
Onye Chineke goziri kele Ya n'ọdịmma,
Onye Chineke goziri chọọ ya mma n'elu ụwa.
Ị mara na Chineke lụlụ nnukwu ọlụ ọma na ndụ gị,
Ị g'abịa nụ sị ya n'ọma ka, kedu ihe anyị g'enye nụ Gị.
Ndị Chineke goziri bịa jaa Ya mma,
Onye ndị Chineke goziri chọọ ha mma n'elu ụwa.
Ị g'agba m ihe nwere n'elu ụwa n'abụghị Chukwu nyere gị,
Ị g'abịa nụ sị Ya ọ meka.
VERSE 1
Ị so na ndị Chineke goziri bịa jaa Ya mma, bịa jaa Ya mma.
Ugb'a rugo mgbe ị g'eji kele Ya tuoro Ya mma mma.
E lele anya n'azụ buru onyinye gị hinne.
Onye onyinye lu ya g'akwụgwọ nwanne m.
VERSE 2
Ị so na ndị Chineke nyere ọgụgịdị, Chineke n'akpọ gị.
Ị ma na Chineke zọọ gị bịa k'ị jaa Ya mma, bịa jaa Ya mma.
Ị so na ndị Chineke nyere amamiihe ị chezoo ya ee.
Ọ nyere akụ n'ụba ha wee chezoo? Chineke n'ajụ gị ị chezoogo onyinye Ọ n'eju gị ị chezoogo.
VERSE 3
Ị so na ndị Chineke nyere ndụ n'elu ụwa ha chezoa Ya ee.
Ọ bụ Chineke nyere gị ahụike ị chezoogo?
Ị ma na Chineke bụ Chi n'enye nwa? k'ị chezoogo nwanne m,
Ị ma n'ọ bụ Chi n'enye nwa? k'ị chezoogo nwanne m.