O GOZIE GI, KELE YA by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Celebrations Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Onye Chineke goziri kele Ya n'ọdịmma, Onye Chineke goziri chọọ ya mma n'elu ụwa. Ị mara na Chineke lụlụ nnukwu ọlụ ọma na ndụ gị, Ị g'abịa nụ sị ya n'ọma ka, kedu ihe anyị g'enye nụ Gị. Ndị Chineke goziri bịa jaa Ya mma, Onye ndị Chineke goziri chọọ ha mma n'elu ụwa. Ị g'agba m ihe nwere n'elu ụwa n'abụghị Chukwu nyere gị, Ị g'abịa nụ sị Ya ọ meka. VERSE 1 Ị so na ndị Chineke goziri bịa jaa Ya mma, bịa jaa Ya mma. Ugb'a rugo mgbe ị g'eji kele Ya tuoro Ya mma mma. E lele anya n'azụ buru onyinye gị hinne. Onye onyinye lu ya g'akwụgwọ nwanne m. VERSE 2 Ị so na ndị Chineke nyere ọgụgịdị, Chineke n'akpọ gị. Ị ma na Chineke zọọ gị bịa k'ị jaa Ya mma, bịa jaa Ya mma. Ị so na ndị Chineke nyere amamiihe ị chezoo ya ee. Ọ nyere akụ n'ụba ha wee chezoo? Chineke n'ajụ gị ị chezoogo onyinye Ọ n'eju gị ị chezoogo. VERSE 3 Ị so na ndị Chineke nyere ndụ n'elu ụwa ha chezoa Ya ee. Ọ bụ Chineke nyere gị ahụike ị chezoogo? Ị ma na Chineke bụ Chi n'enye nwa? k'ị chezoogo nwanne m, Ị ma n'ọ bụ Chi n'enye nwa? k'ị chezoogo nwanne m.

Download the sheet music

O GOZIE GI, KELE YA

O GOZIE GI, KELE YA

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
3 pages
3 Downloads
Offertory Hymns Celebrations Hymns
0 0

More lyrics you may want