Full Lyrics
VERSE 1
Ọ bụghị ọla ọcha
Ọ bụghị ọla edo
Ihe anyị nwere k'anyị ji bịa
Eze m biko nara nna
REFRAIN
Chukwu biko nara
Eze biko nara doo
Chukwu biko nara
Aj'anyị n'achụrụ Gị
VERSE 2
Ngozi niile si n'aka Gị
Ọnyinye niile si n'aka Gị
Ihe I nyer'anyị k'anyị we nye n'obi ọcha
Biko nara nna
VERSE 3
Aj'anyị n'achụrụ Gị
Bụ nke ndị dị ndụ na ndị nwụranwụ
Ndị ọma sịrị gị si n'ụwa kpọrọ
Eze doo nabatanụ ha nna