Full Lyrics
Nsọ, nsọ, nsọ, Chineke dị nsọ,
Nsọ, ka Chineke Nna m o dị nsọ,
Chineke dị nsọ.
Oseburụwa Chukwu nke igwe n'agha,
Nke igwe n'agha,
Ebube gị jufụtara n'elu igwe n'ụwa.
Ebube gị,
Hosanna, Hosanna n'elu kasị elu,
N'elu kasị elu, kachasị elu.
Hosanna o! Hosanna o!
Hosanna n'elu kachasị elu.
Ọ dị nsọ, ọ dị nsọ, ọ dị nsọ,
Bụ onye bịara n'aha Dinwenụ,
Dinwenụ, n'aha Dinwenụ.