Full Lyrics
REFRAIN
Nna biko etuchala mmehie ya
Cheta ebere gị
Were obi ebere gị
Wee kpọọ ya ikpe
VERSE 1
Chukwu Nna biko chetara
I kere anyị n'onyinyo nke gị
Aya nanị ka m arịọ gị
Gosi ya ebere
Chukwu Nna biko
VERSE 2
Cheta okwukwe ya na gị
Atụkwasị obi o nwere na gị
Ekpere ya na gị
Gosi ya ebere
Chukwu Nna biko
VERSE 3
Cheta afụfụ o tara
Cheta ọnọdụ o nọrọ
Cheta ikwusi be ya
Gosi ya ebere
Chukwu Nna biko
VERSE 4
Cheta ntụkwasị obi mmadụ
Ndi tụkwasịrị obi n'ebe ị nọ
Ndi chetara ibe n'enye maka gị
Site na ya gosi ya ebere
Chukwu Nna biko