Full Lyrics
VERSE 1
Ikuku I nyeremo, ezi Chineke;
ikuku ndu mo.
Ngozi, ngozi o!
Oburunam g'akw'ugwo ya Chineke,
o bu onye ka m g'ebitenu o?
REFRAIN
Ngozi o!
Onyinye mara nma, onyinye di ukwu,
onyinye mar'abuba ka m g'ebunye Chineke.
Onye jiri ngozi Ya saa m'ahu,
tee m'ude, yibe m k'uwe!
Ngozi eh!
I man'ahu m buzi ngozi, ngozi.
Ngozi Chineke!
VERSE 2
Mmiriozuzo Chukwu nyer'anyi,
ha nile bu ngozi, ngozi.
Ngozi eh!
Imana Chineke jigide mmiri si n'igwe,
uwa g'agba oku o!
VERSE 3
Onwa na anyanwu n'eti n'igwe,
ha na kpakpando bu ngozi,
maka na onwa n'eny'ihe,
anyanwu n'eny'ihe,
kpakpando n'amuke!
VERSE 4
Chi ojiji anyi ji ezur'ike n'el'uwa,
o bukwa ngozi Chukwu o!
Oburu na chi ejigh'eji n'ubochi o,
mmadu g'arugbukw'onwe ya n'olu o!
VERSE 5
Onyinye bar'uba;
onyinye nwa, onyinye aku n'ihe onwunwe.
Ngozi eh!
Ngozi Gi Chineke mo,
gbara m gburugburu,
n'orube m'o kiri kiri o!