NGOZI DIRI NDI ONYENWEANYI HOORO by Chidi Ezeigwe — Lyrics

Chidi Ezeigwe Igbo Responsorial Psalms Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ngọzi dịrị ndị Onyenweanyị họọrọ Ka ha bụrụ ndị nke ya. Ka ha bụrụ ndị nke ya. VERSE 1 Okwu nke Onyenweanyị bụ eziokwu, Ọ naakwụdosi ike n'ọrụ ya niile, Ọ hụrụ eziomume na ikpe nkwụmọtọ n'anya, Ịhụnanya ya juputara n'ụwa. VERSE 2 Ọ bụ site n'okwu ọnụ nke Onyenweanyị Ka O jiri kee elu igwe niile, O ji ufuru ya kee ihe niile dị n'ime ya, N'ihi na O kwuru okwu ụwa wee dị, O nyere iwu, ihe niile e kere eke wee dị. VERSE 3 Ma lee ka Onyenweanyị si eleta Ndị niile naatụrụ y'egwu anya, Ndị niile tụkwasịrị obi ha, obi ha, n'ịhụnanya ya, Ka O wee zọpụta mkpụrụ obi ha n'ọnwụ Ma chekwaba ha n'oge ọnwụ. VERSE 4 Mkpụrụ obi anyị n'eche Onyenweanyị, Ya bụ Onye nyemaka na onye ọgbugba anyị, Ka ịhụnanya gị dị n'ebe anyị nọ, O Chineke, O Chineke, Ebe nchekwub'anyị dị na gị.

Download the sheet music

NGOZI DIRI NDI ONYENWEANYI HOORO

NGOZI DIRI NDI ONYENWEANYI HOORO

By Chidi Ezeigwe
Solfa
Igbo
1 page
6 Downloads
Responsorial Psalms
0 0

More lyrics you may want