Full Lyrics
REFRAIN
Ngozi Chukwu ngozi ya bar'ụba na ndụ mo
Ngozi Chukwu ngozi ya ebuka na ndụ mo ekele
Ekele n'ọfịjamma kam jiri bịa n'iru gị Chukwuọma
Maka ngozi niile nke ị gọziri mo Chukwu ọma dị mma nar'ekele
BRIDGE
Ndụ nk'inyere mo Ọbụkwa sọ ngozi gị Chukwu
Ahụike ị nyere mo Ọbụkwa sọ ngozi gị Chukwu
Ịhụnanya gị ebu ka n'ebe anyị nọ Oseburụwa
Chukwu okike maka ngozi niile nke ị gọziri mo Chukwu ọma
dị mma na r'ekele
VERSE 1
Ọnụm juru n'ekele maka ngozi Chukwu n'arụ mo
bido n'isi m ruo n'ọkpa mo ngozi Chukwu dị n'arụ mo
VERSE 2
Ngozi Chukwu n'ebe m nọ a naghị agụta ya ọnụ
ngozi Chukwu dị m n'avụ
VERSE 3
Ọdị godi mma dị njọ
Ụwa mu godi m amụ ọ gbasaghịm
VERSE 4
Ekwensu n'ogb'ufanofu
egwu adịghị atụ mo