OTITO DỊRỊ CHINEKE by Fr. Bart C. Ezeokafor — Lyrics

Fr. Bart C. Ezeokafor Igbo Gloria Penitential Rite / Kyrie Mass Settings Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[INTRO] Otito dịrị Chineke n'elu kach'elu; N'ụwa udo udo dịrị ndị mmadụ ndi nwere obi ọma. [REFRAIN] Otito dịrị Chukwu n'elu kasi elu. Anyị ajaa Gị mma eh, Anyị ekele Gị n'ihi nnukwu ebube Gị, Oseburuwa Chukwu Nna ji ike nile. [VERSE 1] Anyị agozie Gị, Anyị etoo Gị, Ezenwe eluigwe Chukwu Nna ji ike nile. [VERSE 2] Dinwenu Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ, Dinwenu Chukwu Nwatụrụ nke Chineke Nwa nke Nna, Gị Onye naekpochapụ njọ nk'ụwa meere anyị ebere, Gị Onye naekpochapụ njọ nk'ụwa nụr'arịrịọ anyị, Gị Onye nọ n'aka nri Nna meere anyị ebere. [VERSE 3] N'ihi na sọ Gị dị Nsọ, sọ Gị bụ Dinwenu, sọ Gị Jesu Kristi, kachasị dị elu, Gị na Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna Amen, Amen! Otito dịrị Gị n'elu kasi elu. [ONYENWEANYỊ MEE EBERE] Oh Onyenweanyị mee ebere, Onyenweanyị biko meere anyị ebere. Kristi mee ebere, Oh Kristi biko meere anyị ebere. Onyenweanyị mee ebere, Onyenweanyị biko meere anyị ebere.

Download the sheet music

OTITO DỊRỊ CHINEKE

OTITO DỊRỊ CHINEKE

By Fr. Bart C. Ezeokafor
Solfa
Igbo
2 pages
17 Downloads
Gloria Penitential Rite / Kyrie Mass Settings Hymns
0 0

More lyrics you may want