Full Lyrics
REFRAIN
Anyị abịal'inye gị ekele,
Chukwunna, nna, nna. Chukwunna, nna, nna. Chukwunna,
nara onyinye anyị n'obi ọcha.
E tatụcha mmehie nile anyị mere,
nara ya biko Chineke ma gozie ya n'obi ebere gị.
VERSE 1 (Sop/Alto)
Ezi Chineke nar'onyinye ụmụ gị n'enye gị,
nna ọ bụ onyinye si n'akụ nụba nk'i nyere anyị
anyị n'arịọ gị ka ị nara ya dị k'onyinye
Abel n'ụlọdịbọ gị, na aja nk'ụkọchukwu gị Melkisedek.
VERSE 2 (Tenor/Bass)
Cheta na mmiri ozuzo bụ onyinye Chineke nyer'anyị n'efu,
Ọnwa na anyanwụ, ha ncha bụ ọrụaka Chukwu,
Ikuku n'enye anyị ndụ bụ onyinye Chukwu,
gịnị ga egbochi gị inye y'ekele dị mma.
VERSE 3 (Sop/Alto/Ten/Bass)
Oge rugo ụmụ Chineke,
ngwanụ, ngwanụ, kulite nụ,
Kunite nụ k'anyị ga nye ya ekele.
Mak'ihe ọma dị iche Chineke m'er'anyị,
ngwanụ, ngwanụ, kulite nụ,
Kunite nụ k'anyị ga nye ya ekele.
Lee onwegị anya ka ị hụ ọrụ ebube Chineke ruru gị.
ngwanụ, ngwanụ, kulite nụ,
Kunite nụ k'anyị ga nye ya ekele.
Mgbe ị nọ n'ọrịa ọ bụ ya zọrọ gị, nye gị ahụike,
ngwanụ, ngwanụ, kulite nụ,
Kunite nụ k'anyị ga nye ya ekele.
Mgbe ị n'aga njem ọ bụ ya n'edu gị,
ngwanụ, ngwanụ, kulite nụ,
Kunite nụ k'anyị ga nye ya ekele.
Oge erugo ụmụ Chineke,
ngwanụ, ngwanụ, kulite nụ,
Kunite nụ k'anyị ga nye ya ekele.