Full Lyrics
[CHORUS]
Nara O Chineke onyinye anyị n'ebunye Gị
nara O Chukwu Nna aja'nyị n'achụrụ Gị
anyị n'achụ ya maka mgbaghara njọ
Ezi Chukwu nara ya gozie anyị biko
[VERSE 1]
Ezi Chineke anyị n'ehunyere Gị
owuwe ihe' ubi nke' ijiri gozie anyị
n'obi ọma Gị na afọma Gị
nara gozie ya dịka aja nke Abel
[VERSE 2]
Onyinye'I nyer'anyị k'anyị butere Gị
achịcha dị ọcha na mmanya dị ụtọ
[VERSE 3]
Nara ya n'aka Ụkọchukwu Nna biko
gbanwoo ya ka o wee ghọr'anyị nri nzọpụta ebebe