NARA AJA by Azuine-Uche Bruno — Lyrics

Azuine-Uche Bruno Igbo Offertory Hymns Hymns Holy Trinity Staff & Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Nara Nna nara, nara aja anyị n'achụrụ Gị n'Ọlta Gị. VERSE 1 Nara Nna nara achịcha na mmanya anyị n'ebunye Gị, gọzie ya Nna Mee ya ka ọ ghọọrọ anyị ahụ n'ọbara Onye nwe anyị. VERSE 2 Lee Ụkọchukwu Gị k'ọ nọ n'iru Ọlta Gị Ka o chunyere Gị aja anyị aja dị nsọ Were ebere lekwasị anya n'onyinye anyị. VERSE 3 Ka onyinye anyị n'ebunye Gị Wetara anyị nzọpụta udo na ịhụnanya. VERSE 4 Nara biko Nna ekpere anyị Meere anyị ebere gbaghara anyị. VERSE 5 Otito dịrị Nna Nwa na Mmụọ Nsọ Otu ọ dị na mbụ k'ọ dị ugbu a Ọ g'adịgide n'ụwa ebighị ebi.

Download the sheet music

NARA AJA

NARA AJA

By Azuine-Uche Bruno
Staff & Solfa
Igbo
3 pages
3 Downloads
Offertory Hymns Hymns Holy Trinity
0 0

More lyrics you may want