Full Lyrics
CHORUS
Nara Oseburuwa
Aja nke ụmụ gị
N'ehunyere gị
Were ebere nara ya
Chukwu ka aja Melchizedek.
VERSE 1
Chineke Onyeobiọma
Were ebere lekwa aja anyị na onyinye anyị
Ka aja nke anyị ji akwụ ụgwọ mmehie doo
Medaa gị obi maka njọ anyị.
VERSE 2
Chineke Onye onyinye
Aja anyị naachụ bụ maka ndị dị ndụ na ndị nwụranwụ
Were ebere nara onyinye anyị o Chukwu
Ma lekwe anyị gọzie.
VERSE 3
Chineke Chukwu ịhụnanya
N'ihi njọ anyị k'iji zite Ọkpara gị
Were onwe ya chụọ aja
N'elu obe Calvary ime
K'i gosi nnukwu ịhụnanya.