Mmeso oma Chineke by Chris Nwankwo — Lyrics

Chris Nwankwo Igbo Offertory Hymns Hymns Celebrations Staff & Solfa notation

Full Lyrics

[INTRO] Ihe Chukwu n'emere m ebuka Ih'ọm'ọ n'emere m ebuka Ewo ngozi Chukwu bar'ụba n'ebem nọ N'ezie ọbụrụ na m [CHORUS] Kọba ya tata na chi g'eji chi g'efo. M kọba mmeso ọma Chineke chi g'eji Chi g'abọ ma y'enwena nkọcha M kọb'ihe nil'Ọ n'emere m o chi g'eji Chi g'abọ ma y'enwena nkọcha Ndị nke Chineke bịanụ o Bịanụ soro mu nye Y'ekele N'ihi n'Ọ dị mma Aga m atụrụ ya mmamma [VERSE 1] Oseburụwa Chineke Ọ nọ ns'erua ka daalụ N'ih'I n'emere m o Ọ bụ Gị nyere mu ndụ n'ahụike, Ezi Chukwu Nna m o! Ih'oriri nk'ụbọchị nile Bụ mmeso ọma Gị Ikuku anyị ji adị ndụ n'erute m Bụ mmeso ọma Gị Ọdị mma n'eme mma Biko nar'ekene Mmiriozizo zoo o rute m o Rute ih'ubi m o! Oseburụwa nar'ekele Olisa ndewo Ọkpọr'ụzọ nile nkem n'aga Ọ bụ Gị n'echedo m o Na m n'eje n'anọta n'udo Bụ mmeso ọma Gị Ezigb'ọmụmụ I jiri gọzie m o, Bụ mmeso ọma Chukwu Amara Chineke ruonanu m aka Ụwa lekwanụ m o! Aga m ebur'ih'onyinye m nwere Bịa tuoro Ya mmamma Ndị enyi na nd'ikwu n'ibe m o, Soronụ m k'anyị [VERSE 2] Jebe mukana m kọba mmeso ọma Ked'ihem g'emere Chineke Maka ih'ọma nile nk'Ọ n'emere m o? A ga m ebul'iko nzọpụta Kpọku' Aha Gị, Oh! Chineke Nar'ekele A ga m ebur'ukwe nk'ọtito n'iju mma Bịa n'iru Gị, Oh! Chineke Nar'ekele A ga m ebur'une n'ab'akwara, Gbar'egwu ngala bịa n'iru Gị, Oh! Chineke, m o, Nganga n'egbuzi m egbu o Chineke nar'ekele Ekele n'ọtito nile dịrị Gị Onye nwe m N'ihi n'Ị dịịrị mu mma

Download the sheet music

Mmeso oma Chineke

Mmeso oma Chineke

By Chris Nwankwo
Staff & Solfa
Igbo
7 pages
2 Downloads
Offertory Hymns Hymns Celebrations
0 0

More lyrics you may want