Full Lyrics
[CHORUS INTRO]
Chukwu Nna ekele, ekele kam jiri bịa nara ekele
Lee mekem ihem yọrọ ya n'efu ka ọ gọziri m o
Ezi Nna obinigwe mere ya n'efu k'o mere ya ọ pụrụ iche
Chukwu anam kwesiri ekele; n'ime ọnọdụm nile
Nna obinigwe kwesiri ekele o, n'ọnọdụm nile ekele
Bịa obinigwe kwesiri ekele, ị tosiri dimkpa
Ọ dịli mu mma, ọ dịli mu njọ
I zuru ka eme, agam atụrụ Chinekem mmamma eh!
[REFRAIN]
Chiokike mmamma imela
Ọkaka mmamma onyeọma imela
Agam atụrụ Chinekem mmamma
Chiọma mmamma imela
Chiọma eh, Chiọma eh, mmamma eh!
Chiọma nara ekele
Chiọma eh, mmamma imela
Agam atụrụ Chinekem mmamma sị Ya onyeọma imela
Kam tuoro Chineke mmamma onyeọma imela
[VERSE 1]
Mgbem diro gbaram gburugburu
Na chọghịrị mu n'ebili mmiri
Akpọkuurum Olisabinigwe
A ya zọrọ m o
Ekwensu bịa chọgbuo ya kankịta
Ụjọ anaghị atụ m o
Maka n'ọ dọgwu karịrị odogwu
Agụ bata mgbada wara ọsọ
[VERSE 2]
Chukwu Ọkaka Nna Chukwugwe mmamma
Ibi n'igwe nara ekelem jiri bịa
Ọkaka Nna Chiọma bi n'igwe mmamma
Izi ọ gọziri m a gọzi
Ọ gọziri m a gọzi
E gọziri m a gọzi
[SOPRANO OSTINATO]
Ọ bụ onye ga emere mu ka Chukwu obinigwe
Maka ndụ nke Chukwu Nna nyere mu o
Anam asị mmamma
Ekele ekele ekele dịrị Gị Chukwu obiọma
Ọkaka Nna Chukwugwe mmamma imela
Ibi n'igwe ọ gọziri m a gọzi
Chukwu Nna ekele ekele