Full Lyrics
[REFRAIN]
Mkpụrụobi m ny'Oseburuwa otito.
Mkpụrụobi m o, Mkpụrụobi m nye Ya otito.
Ya otito.
[VERSE 1]
Ọ bụ nanị Oseburuwa na edebe nkwa O kwere oge nile,
na eme kwara ndị a n'emegbu emegbu ebere.
Ọ bụ Oseburuwa n'enye ndị agụụ na agụ nri,
wee na atọhapụ ndị nọ na mkpọrọ, ha wee nwere onwe ha.
[VERSE 2]
Ọ bụ Oseburuwa n'eme ka ndị kpuru isi hụba ụzọ ọzọ.
Ọ n'ekulite ndị mmadụ, ndị mmadụ n'enweghị ka ọha ha.
Oseburuwa hụrụ ndị eziomume n'anya,
Oseburuwa bụ Onye nche ndị ije na ndị ọbịa.
[VERSE 3]
Oseburuwa n'elezi ndị ajadụ, na ụmụaka n'enweghị Nne na Nna anya.
wee na eme, na eme ka ihe siere ndị ajọ mmadụ ike.
Oseburuwa Chukwu nke Ziọn g'abụ Eze ndụ ndụ g'anụ nile.