Full Lyrics
KYRIE (Onye Nwe Anyi, Mee Ebere)
Onyenw'anyi meebere doo, Onyenw'anyi meebere.
Kristi, mee ebere, Kristi mo, Kristi, mee ebere, Kristi mo, Kristi meebere doo.
GLORIA
CHORUS
Otito diri Chineke n'elu kachelu, n'uwa udo diri mmadu, ndi nwere obi oma.
VS 1A
Anyi a jaa Gi mma, anyi a gozie Gi.
VS 1B
Anyi e sekpuoro Gi, Anyi e too Gi.
VS 1C
Anyi e kele Gi n'ihi nnukwu ebube Gi.
VS 2A
Osebuluwa Chukwu, Eze nke eligwe.
VS 2B
Chukwu Nna, Onye ji ike nile.
VS 2C
Dinwenu Jesu Kristi, Sotu Nwa Chineke muru.
VS 3A
Dinwenu Chukwu Nwaturu nke Chineke, Nwa nke Nna.
VS 3B
Gi onye n'ekpochapu njo n'uwa, meere anyi ebere.
VS 4A
Gi onye n'ekpochapu njo n'uwa, nara aririo anyi.
VS 4B
Gi onye no n'aka nri Nna, meere anyi ebere.
VS 4C
Nihi na so Gi di nso, So Gi bu Dinwenu.
VS 5A
So Gi, Jesu Kristi.
VS 5B
Kacha di elu, Gi na Muo Nso.
VS 5C
N'ebube Chineke Nna.
Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen.
CREDO (Ekwere m N'Otu Chineke)
REFRAIN 1
Ekwerem n'otu Chineke Nna Nna ji ike nile.
VS 1
Onye mere eligwe n'ala, n'ihe nile apuru ihu anya, na ndi apughi ihu anya.
VS 2
Ya n'otu Onyenwanyi Jesu Kristi, sotu Nwa Chineke muru.
VS 3
Nna muru tupu wa tuwa nile. Chukwu si na Chukwu, Ihe si n'Ihe.
VS 4
Ezi Chukwu si n'ezi Chukwu.
VS 5
Amuru Ya amu, emeghi Yeme. Ya na Nna bu otu Ihe nudi di ebighi ebi Ha jiri buru Chukwu.
VS 6
Onye si na Ya mee ihe dum, Onye mak'ihi anyi bu mmadu Na mak'ihi nzoputa anyi, siri n'eligwe gbadata.
AD LIBITUM
O wera ahu na Vejin Maria site na Muo Nso O buru mmadu.
Akpogbuo Ya n'obe, A kpogbuo Ya n'obe n'ihi anyi n'oge ochichi Pontius Pailet. O taahuhu elie Ya.
Ma obilitere n'ubochi nke ato dika Akwukwo Nso si kwuo.
REFRAIN 2
Obilitere n'onwu, obilitere n'onwu, ogoro n'eligwe, noro n'aka nri Nna.
VS 10
Ma O g'abia ghachigzo n'ebube Ya ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpe.
VS 11
Onye Ochichi Ya n'enweghi njedebe.
VS 12
Ekwerem na Muo Nso, Dinwenu na Onye n'enye ndu.
VS 13
Onye si na Nna na Nwa puta, Onye a n'esekpuru.
VS 14
N'eto do Ya na Nna na Nwa, Onye si na ndi amuma kwuo okwu.
VS 15
Ekwerem n'a Nzuko nke di otu, di Nso, Bu n'u katolika bu n'u k'apostolik.
VS 16
Ekwuputa m otu mmirichukwu maka mgbaghara njo ga.
Anam atuanya, anam atuanya mbilite n'onwu ndi nwuru anwu na ndu uwa gabianu. Amen, amen, amen, amen, amen, amen, amen, amen.
SANCTUS (Nso Nso Nso)
Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso.
Osebuluwa Chineke n'igwe ndiggha.
Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso.
Igwe n'ala juputara n'ebube Gi.
Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso.
Hozana, Hozana, Hozana, Hozana, Hozana n'elu kacha elu.
Hozana, Hozana, Hozana, Hozana n'elu kacha elu.
Hozana n'elu kacha elu.
O di ngozi bu Onye biara,
Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso.
N'aha Onyenwanyi, Onyenwanyi.
Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso, Nso.
Hozana, Hozana, Hozana, Hozana n'elu Hozana n'elu.
Hozana, Hozana, Hozana, Hozana n'elu Hozana n'elu kacha elu.
PATER NOSTER (Nna Anyi No N'eligwe)
Nna anyi no n'eligwe, k'otito diri aha Gi.
REFRAIN
K'ochichi Gi bia. Ka eme uche Gi n'uwa, ka esi eme ya n'eligwe.
VS 2
Nye anyi nri n'ubochi anyi.
VS 3
Gbaghara anyi nmehie anyi, di k'anyi si gbaghara ndi mehier'anyi.
VS 4
E kwela, Nna, e kwela, e kwela k'anyi kwenye n'onwunwa.
VS 5
Ma zoputa anyi n'ajo ihe, ma zoputa anyi n'ajo ihe.
AGNUS DEI (Nwaturu Nke Chukwu)
Nwaturu nke Chukwu, Nwaturu Chukwu O! Nwaturu Chukwu.
Onye n'ekpochapu njo n'uwa Biko meere anyi ebere.
Nwaturu nke Chukwu, Nwaturu Chukwu O! Nwaturu Chukwu.
Onye n'ekpochapu njo n'uwa nye anyi, Onyenwanyi, nye anyi, Chukwu nye anyi udo anyi n'ayo anyi udo anyi n'ayo anyi udo.