Full Lyrics
REFRAIN
Maka mmeso ọma Chineke na ndụ m o, nwanne m mere m ji
Jiri ọṅụ wee bịa ikele Ya.
Maka mmeso ọma Chineke na ndụ m o, nwanne m mere m ji
Jiri ọṅụ wee bịa.
Kam kele Nna m o n'ihi n'o nyewo m ndụ
Kam kele ọkaka n'ihi n'ọ gọziwo akarịa kam
Agam akọr'ụnụ ihe Chim mere m o
Chukwu nyere m ndụ lee
Chukwu ọma nyere m ahụike
Chukwu gwọrọ m ọrịa lee
Chukwu ọma mere m obi sarị sarị n'ar'eke le doo
A bịawo m ikele Gị.
VERSE 1
Ndị o nyere ndụ, soro m k'anyị jee kelee
Ndị o nyer'ahụike, soro m k'anyị jee kelee.
VERSE 2
Ndị ọ gọziri, soro m k'anyị jee kelee
Ndị o nyer'akụ, soro m k'anyị jee kelee.
VERSE 3
Ndị ọ zọrọ ndụ, soro m k'anyị jee kelee
Ndị ọ duru ije, soro m k'anyị jee kelee.
VERSE 4
Ndị o nyer'anwụ, soro m k'anyị jee kelee
Ndị o nyer'ikuku ndụ, soro m k'anyị jee kelee Chineke.