LEGIDE JESUS ANYA by Sam Ojukwu — Lyrics

Sam Ojukwu Igbo Lenten Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Anụrụ m olu Onyenwem Jesuu K'ọ n'asị Onye kam g'ezi gaa Onye g'ejekwar' anyị o? Anwụrụ m ọnwụ n'elu obe N'ihi gị Onye kam g'ezi gaa Onye g'ejekwar' anyị o? CHORUS Ọ gị onye kwere na Jesuu Ọ gị onye kwere na Jesuu Na Jesus Kraist bụr' obe gị Obe dị arọ legide Jesus anya Legide Jesus anya Legide Jesus anya Bụr' obe gị ike agwụla gị o VERSE 2 Anụrụ m olu Onyenwem Jesuu K'ọ n'asị gaa n'el'ụwa dum Kwusaa Oziọma nkem Agam enyekw' ụnụ ngọzi ebighi ebi Onye kam g'ezi gaa Onye g'ejekwara anyị o? VERSE 3 Anụrụ m olu Onyenwem Jesuu K'ọ n'arịọ hụ Chineke gị n'anya N'ike n'ume gị nile N'ihina ịhụnanya bụ iwu nke kachaelu Hụnịta onwe ụnụ n'anya Ọtụ m siri hụkwa ụnụ CODA Amen, Amen, Amen

Download the sheet music

LEGIDE JESUS ANYA

LEGIDE JESUS ANYA

By Sam Ojukwu
Solfa
Igbo
3 pages
2 Downloads
Lenten Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want