Full Lyrics
VERSE 1
Anụrụ m olu Onyenwem Jesuu
K'ọ n'asị Onye kam g'ezi gaa
Onye g'ejekwar' anyị o?
Anwụrụ m ọnwụ n'elu obe
N'ihi gị Onye kam g'ezi gaa
Onye g'ejekwar' anyị o?
CHORUS
Ọ gị onye kwere na Jesuu
Ọ gị onye kwere na Jesuu
Na Jesus Kraist bụr' obe gị
Obe dị arọ legide Jesus anya
Legide Jesus anya
Legide Jesus anya
Bụr' obe gị ike agwụla gị o
VERSE 2
Anụrụ m olu Onyenwem Jesuu
K'ọ n'asị gaa n'el'ụwa dum
Kwusaa Oziọma nkem
Agam enyekw' ụnụ ngọzi ebighi ebi
Onye kam g'ezi gaa
Onye g'ejekwara anyị o?
VERSE 3
Anụrụ m olu Onyenwem Jesuu
K'ọ n'arịọ hụ Chineke gị n'anya
N'ike n'ume gị nile
N'ihina ịhụnanya bụ iwu nke kachaelu
Hụnịta onwe ụnụ n'anya
Ọtụ m siri hụkwa ụnụ
CODA
Amen, Amen, Amen