LEENU NWATURU CHUKWU by Fr Stanley Orazulike — Lyrics

Fr Stanley Orazulike Igbo Agnus Dei (Lamb of God) Communion Hymns Eucharistic songs Anthems Set pieces Concert Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Leenu Nwaturu Chukwu Achịcha ndụ ma nke si n'igwe gbadata n'ụwa Ọ bụ nri ọma Kristi nyer'anyị na Eucharistia dị asọ S'anyị rie k'anyị wee nwee ndụ ebebe K'anyị jee nụ nara ya n'ihi na ọ bụ nri ọma Anyị nwere isi ọma bụ ndị n'eri ya VERSE 2 Etosighịm k'ị bata nwe nụ n'im'obi m o Chukwu Nna Dinwenu na Chukwu m o bata n'im'obi m o Chineke m o etosighịm k'ị bata n'im'obi m o Maka njọ m o etosighịm k'ị bata n'im'obi m o Dinwenu kwuo nụ sọ okwu n'obi m gaadịrị rị Dinwenu kwuo nụ sọ okwu n'obi m gaadịrị rị VERSE 3 Chukwu Nwa si n'igwe gbadata n'ụwa We r'onwe ya mee r'anyị achịcha nke ndụ Ọ tara ahụhụ nwụọ ọnwụ mak'anyị We r'ọbara ya dị oke ọnụ gbapụt'anyị na njọ Kristi n'akpọ anyị ụmụnne ya Ndị enyi ya ndị ọ hụrụ n'anya S'anyị bịa nara ya REFRAIN N'ezie Jeeso m o ị bụ nri ọma, nri ọma m o N'ezie Ahụ n'Ọbara Kristi bụ nri ọma n'enye ndụ N'ezie Jeeso bụ nri ọma N'ezie Jeeso bụ achịcha nri ndị Mmụọzi Bịa nara ahụ ya rie Bịa nara Ọbara ya ṅụọ Ọ bụ ezi ih'oriri n'ezie Ọ bụ ezi ih'ọṅụṅụ nri ọma n'enye ndụ

Download the sheet music

LEENU NWATURU CHUKWU

LEENU NWATURU CHUKWU

By Fr Stanley Orazulike
Solfa
Igbo
4 pages
1 Downloads
Agnus Dei (Lamb of God) Communion Hymns Eucharistic songs Anthems Set pieces Concert
0 0

More lyrics you may want