Full Lyrics
VERSE 1
Nnukwu ụkọchukwu,
Onye n'eme ihe naasọ Chineke ya.
Onye n'eme uche Nna ya.
Lee ya ka ọ naeje ije nwa mma n'eziokwu,
Chineke agọzigọ ya.
A hụghị onye dị ka ya n'idebe iwu nke onye kasi elu,
Ka ugwu ya dị ebiebi n'etiti ndị nke ya.
VERSE 2
Lee ya ka o ji mkpara ya,
Ọ ji achụgwe atụrụ ya,
Atụrụ ọ hụrụ n'anya.
Ọ naedu g'anyi n'ebe ahịhịa ndụ juru eju.
Ọ bụ n'ezie ezigbo onye nche atụrụ.
VERSE 3
Lee Nnukwu ụkọchukwu,
Lee nnukwu ụkọchukwu,
Lee nnukwu ụkọchukwu.
Onye n'eme ihe n'asọ Nna ya,
Ka ọ n'achị.