Full Lyrics
CHORUS
Kpadoro onwe gị akụ n'eluigwe
K'obobo ghị ngb'utu
ebe akịka n'ghị nta ya
kpadoro onwe gị akụ n'eluigwe
ebe ndị ori adịghị etiwa ezu.
VERSE 1
Ha o Chineke ọfụma n'ụwa wer' okwukwe foo ya
okwukwe na ọrụ.
Ha o Chineke ọfụma n'ụwa
ọ g'enye gị ihe bighobi.
VERSE 2
Ịhụnanya bụ nani ya bụ Iwu Chukwu ti l'anyi k'anyi hụ Ya
n'anya hụkwa madụ ibe anyị n'anya n'ihi Ya
Were ịhụnanya we foo Chukwu kere anyị k'ụba gị di ukwu n'eluigwe.
VERSE 3
Ebe akụ gị dị, ebe ahụ k'obi gị dị, chọwa ihe nke a
dị gị mma nke si tere n'ihi na ọ fọ Chukwu
Chukwu bụ Nna
Chineke foo Ya ọfụma Ị n'akpadoro nke g'adị gị mma.