KILIBE - GOLIBE by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Celebrations Staff & Solfa notation

Full Lyrics

[INTRO] Ọg'onyiny'erugo, ọg'anyi ji atụrụ Chukwu nmanma, Wee nar'amara Ya, wee nara ngọzi Ya. Ọbụ gịnị g'egbochiri m'ikele Chineke Maka ngọzi niile O jiri nọrube m o, Gbaa m'okirikiri? [CHORUS] Mkpụrụobi m, golibe na Chineke, golibe. Ụmụwa, kilibe afọma Chukwu n'arụ m o. Ọ hichara m'anya mmiri! Mkpụrụobi m n'egori na Chukwu m o! [VERSE 1] Kilibe afọma Chukwu n'arụ m o. Naranụ onyinye m o, Chineke, gọzienụ ya. Naranụ onyinye, Onye ker'ụwa, gọzienụ m o. Ọnwegh'ihe m nwere, ezi Chineke karị'onyinye si n'obi m o! [VERSE 2] Naranụ ya, dịka nke Abel. Onyinye bur'ibu, Onyinye dị ọcha, Onyinye dị nma, bụ onyinye na asọ Chukwu. Onyinye bur'ibu, dịkw'ọcha dị nma, ọbụ ya ka m jiri bịa. Naranụ ya gọzie Chineke, n'aka nwodibo Gị. [VERSE 3] I gọziri m Chineke, nye m'ụmụ, nyekwa m'akụ n'ụba. Aga m'agọzi aha Gị, tuoro Gị nmanma. Ngọzi Gị bar'ụba Chineke, amara Gị juru anya! Kilibe afọma Chukwu o! Golibenu na Chukwu o!

Download the sheet music

KILIBE - GOLIBE

KILIBE - GOLIBE

By Jude Nnam
Staff & Solfa
Igbo
6 pages
3 Downloads
Offertory Hymns Hymns Celebrations
0 0

More lyrics you may want