Full Lyrics
[INTRO]
Ọg'onyiny'erugo, ọg'anyi ji atụrụ Chukwu nmanma,
Wee nar'amara Ya, wee nara ngọzi Ya.
Ọbụ gịnị g'egbochiri m'ikele Chineke
Maka ngọzi niile O jiri nọrube m o,
Gbaa m'okirikiri?
[CHORUS]
Mkpụrụobi m, golibe na Chineke, golibe.
Ụmụwa, kilibe afọma Chukwu n'arụ m o.
Ọ hichara m'anya mmiri!
Mkpụrụobi m n'egori na Chukwu m o!
[VERSE 1]
Kilibe afọma Chukwu n'arụ m o.
Naranụ onyinye m o, Chineke, gọzienụ ya.
Naranụ onyinye, Onye ker'ụwa, gọzienụ m o.
Ọnwegh'ihe m nwere, ezi Chineke karị'onyinye si n'obi m o!
[VERSE 2]
Naranụ ya, dịka nke Abel.
Onyinye bur'ibu, Onyinye dị ọcha,
Onyinye dị nma, bụ onyinye na asọ Chukwu.
Onyinye bur'ibu, dịkw'ọcha dị nma, ọbụ ya ka m jiri bịa.
Naranụ ya gọzie Chineke, n'aka nwodibo Gị.
[VERSE 3]
I gọziri m Chineke, nye m'ụmụ, nyekwa m'akụ n'ụba.
Aga m'agọzi aha Gị, tuoro Gị nmanma.
Ngọzi Gị bar'ụba Chineke, amara Gị juru anya!
Kilibe afọma Chukwu o!
Golibenu na Chukwu o!