Kenye M Obi Di Ocha (ps. 51) by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Lenten Hymns Responsorial Psalms Prayer Staff & Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Kenye m obi di ocha Chineke. Osebuluwa, kenye m obi di ocha, O Chukwu. Anapukwana m Muo Gi di aso, arapukwana m nime njo, Nna. Kenye m obi di ocha, Chineke mo Chukwu o. VERSE 1 Meere m'ebere Chineke, n'obi oma Gi. N'ik'ebere Gi Chineke hichapu mnmehie m ga. Sachapu m'ocha, Chukwu, n'ikp'omuma diiri mo. Hichapu m njom mere Chukwu gbaghara, doo! Nna. VERSE 2 N'ezie, amarawo m njo mo nile, mgbe nile, njo m guzoro n'iru mo. Nani Gi kam mejoro Chineke mo. Ihe bu aru n'anya Gi Nna kam meworo, Chineke mo, gbaghara. Nna. VERSE 3 I ma m'ikpe Chineke, oziere Gi. Ut'adighiri Gi Chineke, m'i ma m'ikpe. Okwa na njo k'amuru mo, Chineke gbagharanu nwa Gi. Nne m tur'ime mo, Chineke, n'ime njo, Nna. VERSE 4 Amam n'ezi okwu n'adi Gi nma. Kuziere m'ama mihe Chineke n'ime alala obi mo. Were Hyssop fichanu mo, aga m'adi ocha! Sachanu m Chineke, aga m'acha kari aku mmir'igwe, Nna.

Download the sheet music

Kenye M Obi Di Ocha (ps. 51)

Kenye M Obi Di Ocha (ps. 51)

By Jude Nnam
Staff & Solfa
Igbo
7 pages
2 Downloads
Lenten Hymns Responsorial Psalms Prayer
0 0

More lyrics you may want