Full Lyrics
INTRO
Ọbọrọ chi kele chi eh!
Ya kele chi ya eh!
Ọbọrọ chi kele chi ya eh! wo!
El'ụwa dị ogbu
Ọbọrọ chi kele chi ya e
REFRAIN
kele chi eh! Eh! Eh!
Ya kele chi ya eh!
Ọbọrọ chi kele chi ya eh! wo!
El'ụwa dị ogbu
Ị hụla nụ nwa enweghị isi o!
Ụwa enweghị isi o
Ọ bụ sọ Chineke
N'aka Ya kam gara kuo Paa!
Kam gara kuo Paa!
Onyinye dịnma kam ji bịa n'iru Gị Nna
Agam ekuli par'onyinye bịa n'iru Gị Nna
Chukwu, Ọ dịgh'onye dịka Gị!
yoo! Mmh! Mmh! Mmh!
Eh! Aaha!
yoo! Eehe! N'aka Chukwu kam gara kuo Paa!
Paa! Paa! Paa!
VERSE 1
Chee echiche nwanne m banye n'onwe gị
Chineke nyere mmadụ n'ụwa n'agwụ agwụ
Ụwa b'ahịa; Ih'onye zụtara ọ buru laa
El'ụwa b'ahịa onye zụtara nke ya ọ laa!
Ụwa b'ahịa, ndị b'anyị n'ụwa b'ahịa nụ o!
El'ụwa b'ahịa ndị n'eje, ndị n'alaa!
Onye omenma n'emer'onwe ya, Ome n'emer'onwe ya.
Onye metara n'el'ụwa k'ọ jiala mmụọ!
Ụwa abụgh'ebe obibi
Onye jil'ụwa em'ọnụ
Anyị nile bịar'abịa! Mmadụ nile g'ala!
Onye zọn'ụw'azọ!
Onye Chukw'ụwan'ịga n'isi!
Ụw'agbanarị ya n'ọsọ!
Ngwere ghar'osisi ak'akpara ya!
Tụkwasị Chukwu obi n'emesia ọ gadi nma!