Full Lyrics
[K'ANYI KULIENUREFRAIN]
K'anyi kulienu
K'anyi kulienu
jenara Dinwenu Jesu
Onye nọ na Sacramenti nke Eucharistia di nsọ.
[K'ANYI KULIENUVERSE 1]
Dinwenu Jesu Onye ebere
Ya di ọkpu si N'ọrịrị nsọ
na eme ka okwukwe
na esi wanye ike.
[K'ANYI KULIENUVERSE 2]
Ọbara di oke ọnụ Ọ jiri gbapụta anyi
N'ugwu Kalvari
ka Ọ na enye anyi na Sacramenti nke Eucharistia.
[K'ANYI KULIENUVERSE 3]
Onye ọbula g'a eri achicha nke a
Ya cheta na Ọ bu Kristi Nwa nke Chukwu ka O na eri.
[K'ANYI KULIENUVERSE 4]
K'anyi werenu ezi obi na ihụnanya
na asọpụru Kristi Onye zoro na Sacramenti nke Eucharistia.
[K'ANYI KULIENUVERSE 5]
Otito, otito diri Nna,
diri Nwa na Muọ Nsọ.
Otito diri Ya ebebe.
Otito diri Ya ebebe.
[KA M BIRI NIME UNUREFRAIN]
Onye Nwe anyi n'akpọ unu bu ndi enyi Ya,
ndi kwere na Ya, ndi di ngọzi.
Bianu, bianu, bia nara num rie,
bia nara num ñụọ.
Kam biri n'ime unu,
K'unu biri nime m.
[KA M BIRI NIME UNUVERSE 1]
Onye nweanyi n'akpọ unu bu ndi enyi Ya,
ndi kwere na Ya, ndi di ngọzi.
[KA M BIRI NIME UNUVERSE 2]
Abun M achicha, nke si n'igwe bia,
nke nenye ndụ ebebe, nni ndi ọma.
[KA M BIRI NIME UNUVERSE 3]
Onye nri a hụm, na etoghi eto,
mara ọnwe ya ikpe, nyocha obi gi.
[KA M BIRI NIME UNUVERSE 4]
Nni nke ndi muọọma, ka Ọnyere madu,
ndi bu ndi enyi Ya, ndi di asọ.
[KA M BIRI NIME UNUVERSE 5]
Were obi oñu gawa, jee nara Jesu,
nni nke n'enye ndu, nni mkpur' obi.
[KA M BIRI NIME UNUVERSE 6]
Me K'okwukwe m s'ike, dika okwute,
kam kwes'ike oge, nine nke ndụm.
[KA M BIRI NIME UNUVERSE 7]
Dinwenu m ekwere M, ekwere m s'ike,
na gi bu Chukwu nọ, na Eucharistia.
[KA M BIRI NIME UNUVERSE 8]
Dinwenu me ebere, Ka m nata gi,
oge nine, n'oge iku ume ọnwụ.
[KA M BIRI NIME UNUVERSE 9]
Kwe ka m soro, ndi nsọ nke Gi,
n'eto Nna, Nwa, na Muọ Nsọ na ndụ ebighebi.