K'anyi Jee N'ulo Chukwu by Doris Ebere — Lyrics

Doris Ebere Igbo Entrance songs Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS\nKunie nụ o, kunie, kunie nụ nnọọ, kunie nụ o.\nK'anyị jee n'ụlọ Chukwu.\nEnwerem añụrị ogem nụrụ ka ha n'ekwu si,\nK'anyị jee n'ụlọ Chukwu, ụlọ nsọ Chukwu.\nEnwerem añụrị ogem nụrụ ka ha n'ekwu si,\nK'anyị jee n'ụlọ Chukwu, ụlọ nsọ Chukwu.\n\nVERSE 1\nJerusalem obodo ọma,\nAnyị abịago n'ihu gị,\nEbe obibi Chineke dị ka Ugwu Zaịọn,\nMepeere anyị ụzọ k'anyị bata n'ụlọ nsọ Chukwu.\n\nVERSE 2\nK'anyị jee nụ n'ihu Ọlta kporo Ya isi ala,\nK'anyị jee nụ n'ihu Ọlta sekpuoro Ya,\nỤlọ nsọ Chukwu n'enye ọbịa añụrị,\nMepeere anyị ụzọ k'anyị bata e!\n\nVERSE 3\nN'ụlọ nsọ Chukwu, ebe obibi Ya n'enyem añụrị,\nK'anyị jee n'ụlọ Chukwu.\nK'anyị jee n'ụlọ Chukwu,\nỌ gọziwo ọpụpụ anyị na mbata anyị,\nK'anyị jee n'ụlọ Chukwu.\nChukwu kere ụwa k'anyị g'efe nụ o,\nN'ụlọ nsọ Chukwu.

Download the sheet music

K'anyi Jee N'ulo Chukwu

K'anyi Jee N'ulo Chukwu

By Doris Ebere
Staff & Solfa
Igbo
3 pages
5 Downloads
Entrance songs Hymns
0 0

More lyrics you may want