Full Lyrics
REFRAIN
Ọ mewo ya. Chineke m emewo ya.
Ihe m yọrọ Ya k'Omeere.
Ka m si yọọ! O wu onye sị Chukwu mere ka m si mọ.
M'agbal'egwu, nye Y'onyinye n'iru ndị nke Ya.
Ihe m yọọ! Eh! Ọbịa sọgbue m o,
Ihe m yọrọ Ya k'Omeere m o.
Ka m si yọọ!
M'a shị m agbarankwa gamani!
Parii he onyinye gamani!
I y'uri wee gamani!
E parii he onyinye gamani!
Chineke meworo m ihe m yọrọ Ya.
Ka m si yọ Chukwu! yọ Chukwu! yọ Chukwu!
VERSE 1
Ị ma shia paliela m anya m elu nwanne, lee ugwu nile!
O lee be? O lee b'inyeaka m shi bịa?
M'egbue n'ikpere n'ala, kpe ma n'ekpere, yọma nị Chukwu.
Chi m mekwaranụ ka m si yọọ.
Ka m si yọ Chukwu! yọ Chukwu! Ka m si yọọ!
VERSE 2
Anya mmiri ugbir'ugboro, n'ime abalị nile.
Ụmụ ụwa hụkwara m n'arịrị m, ọ gbasakwaranụ ha!
Onye na nke ya!
M'egbue n'ikpere n'ala, kpe ma n'ekpere, yọma nị Chukwu.
Chi m mekwaranụ ka m si yọọ.
Ka m si yọ Chukwu! yọ Chukwu! Ka m si yọọ!
VERSE 3
Ekworem shiogi irinma. Onye kwol'ụwa egbu onwe ya!
Mgbe ọgba juru doro, nwanne m o, m'ọdịgh onye inyeaka.
M'egbue n'ikpere n'ala, kpe ma n'ekpere, yọma nị Chukwu.
Chi m mekwaranụ ka m si yọọ.
Ka m si yọ Chukwu! yọ Chukwu! Ka m si yọọ!