KAMSIYOCHUKWU by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Celebrations Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ọ mewo ya. Chineke m emewo ya. Ihe m yọrọ Ya k'Omeere. Ka m si yọọ! O wu onye sị Chukwu mere ka m si mọ. M'agbal'egwu, nye Y'onyinye n'iru ndị nke Ya. Ihe m yọọ! Eh! Ọbịa sọgbue m o, Ihe m yọrọ Ya k'Omeere m o. Ka m si yọọ! M'a shị m agbarankwa gamani! Parii he onyinye gamani! I y'uri wee gamani! E parii he onyinye gamani! Chineke meworo m ihe m yọrọ Ya. Ka m si yọ Chukwu! yọ Chukwu! yọ Chukwu! VERSE 1 Ị ma shia paliela m anya m elu nwanne, lee ugwu nile! O lee be? O lee b'inyeaka m shi bịa? M'egbue n'ikpere n'ala, kpe ma n'ekpere, yọma nị Chukwu. Chi m mekwaranụ ka m si yọọ. Ka m si yọ Chukwu! yọ Chukwu! Ka m si yọọ! VERSE 2 Anya mmiri ugbir'ugboro, n'ime abalị nile. Ụmụ ụwa hụkwara m n'arịrị m, ọ gbasakwaranụ ha! Onye na nke ya! M'egbue n'ikpere n'ala, kpe ma n'ekpere, yọma nị Chukwu. Chi m mekwaranụ ka m si yọọ. Ka m si yọ Chukwu! yọ Chukwu! Ka m si yọọ! VERSE 3 Ekworem shiogi irinma. Onye kwol'ụwa egbu onwe ya! Mgbe ọgba juru doro, nwanne m o, m'ọdịgh onye inyeaka. M'egbue n'ikpere n'ala, kpe ma n'ekpere, yọma nị Chukwu. Chi m mekwaranụ ka m si yọọ. Ka m si yọ Chukwu! yọ Chukwu! Ka m si yọọ!

Download the sheet music

KAMSIYOCHUKWU

KAMSIYOCHUKWU

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
3 pages
36 Downloads
Celebrations Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want