Full Lyrics
REFRAIN
Ka mgba isi ọma nwub'ọkụ ka isi ọma
ya n'ekusasi n'ekwu aja dị nsọ nke Chukwu.
VERSE 1
Anyị na ndị nsọ nile socha n'igwe abịarute
n'ekwu aja gị ichuru gị aja kasị mma
dịka nw'odibo gị Abel siri churu gị aja nke ya.
VERSE 2
Ele n'anya na njọ anyị o Nna biko,
mana site na nnukwu ebere
gị Nna nara onyinye anyị butere n'ihu gị
nke si n'ezi obi ọcha.
VERSE 3
O Nna anyị n'arịọzi gị ka aja anyị butere n'ihu
gị bụrụkwa aja nke g'amasị gị n'uju.