Full Lyrics
[INTRODUCTIONDUET ENTRY]
Chineke, Onye onyinye, biko gbadata bịa nara onyinye nkem naebunye.
[SOPRANO SOLO ENTRYEXPRESSIVO]
A gụkọgọ m ịdị mma Gị n'ime ndụ m, o wee ju m anya.
M wee gụkọọ ọrụ ọma Gị eh n'ime ndụ m, o wee ju m ọnụ.
Mgbe m naagụkọ ngọzi Gị n'ime ndụ m, o wee ghaa m gharịị, maka na amaghịzịm etu m gaesi kwụghachi Gị ụgwọ maka ha. Ezi
[REFRAINTUTTI]
Chineke, bịa nara ekele muoh na o ruru Gị.
Bịa nara otito muoh na o kwesịrị Gị.
Chi ọma naeme mma, bịa nara oji jamma.
Bịa nara nsọpụrụ ru Gị.
O soro m ka m bulie Gị elu.
O soro m ka m bulie Gị elu.
Egwu mara mma kam ji bịa n'ihu Gị.
Nkwa mara mma kam gaagbara Gị bụ Chi muoh.
Onyinyem buru bịa n'ihu Gị ezughị iji wee kelee Gị.
Biko, nye tụnụ m ohere ka m gosi Gị Chi muoh, ka obi dị m.
Maka afọ ọma Gị.
Maka ngọzi Gị, Nna.
Maka nchedo Gị, e nyem Gị ekele nke si n'obi m pụta.
Maka amara Gị.
Maka ịdị mma Gị n'isi muoh.
Maka obi ọma Gị, e nyem Gị ekele nke si n'obi m pụta.
[VERSE ONE]
A nama jụziọ nwe m "Ọ bụdị sọ m ka Ọ gọziri muoh, wee chọọ m mma n'ụdị dị egwu;
m wee jụbaọ nwe m "Ọ bụdị sọ m ka Ọ naecheta?"
Lekene nụ ahụ muoh! Ahụm bụ sọ ngọzi Chukwu.
Lekene nụ isi muoh! Ọ bụ amara Chukwu dị n'isi muoh!
Gwazie nụ m ihe gaeme kam ghara inye Ya ekele nke ruru Ya. Ezi
[VERSE TWO]
Leenụ m ka m rahụrụte ta ụra n'ahụ ike.
Leenụ, ihem kụrụ n'ubi naemezi nke ọma.
N'ebem naarụ ọrụ, ọgịnị ka ị gaa hụ?
Na ihe naagara m werewere bụ amara Chineke.
Nwannem, gwazienụ m ihe gaeme kam ghara inye Ya ekele nke ruru Ya. Ezi
[VERSE THREE]
Nna, ka m jabanụ Gị mma.
Ka m nye aha Gị otito, gọzie aha Gị dị elu;
Ị bụ Chi muoh, ezi Chukwu!
Ka m gbabaranụ Gị egwu.
Ka m kụbaranụ Gị egwu.
Ka m tuonụ Gị aha nke ruru Ya.
[SOLO ENTRY (MALE) + TUTTI]
Ọ bụ Dike. Ọ bụ Eze. Ọ bụ Odogwu.
Tuo Ya Ebube dike doo!
Isiiyi nke ndụ muoh!
Oke mmiri naegbu ogwe!
Nkenke enyi naachụ igwe enyi ọsọ!
Chukwu, biko nara!
Nara ekelem jiri bịa; nara otitom jiri bịa,
iji gosi Gị ka obi dị m n'ihe ọma Ị naemere muoh.
Ezi si n'obi m pụta.
[CODAA CAPPELLA]
Nara ya, gọzie ya, naagọzikwa anyị, Nna doo!