KA M BULIE GI ELU by Nworie Collins Ifejika — Lyrics

Nworie Collins Ifejika Igbo FILM 2025 FILM Songs Entrance songs Offertory Hymns Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

DUET ENTRY Chineke, Onye onyinye, biko gbadata bịa nara onyinye nkem naebunye SOPRANO SOLO ENTRY A gụkọgọ m ịdị mma Gị n'ime ndụ m, o wee ju m anya. M wee gụkọọ ọrụ ọma Gị eh n'ime ndụ m, o wee ju m ọnụ. Mgbe m naagụkọ ngọzi Gị n'ime ndụ m, o wee gbaa m REFRAIN gharịị, maka na amaghịzim etu m gaesi kwụghachi Gị ụgwọ maka ha. Ezi Chineke, bịa nara ekele mu oh na o ruru Gị. Bịa nara otito nara ekele mu oh na o kwesịrị Gị. Chi ọma naeme mma, bịa nara ọjịja mma. Bịa nara nsọpụrụ ruru Gị. Ọ sọrọ m ka m bulie Gị elu. Ọ sọrọ m ka m bulie Gị elu. Egwu mara mma ka m ji bịa n'ihu Gị. Nkwa mara mma ka m gaagbara Gị bụ Chi mu oh. Onyinyem buuru bịa n'ihu Gị ezughị iji wee kelee Gị, biko, nyetụnụ m ohere ka m gosi Gị Chi mu oh, ka obi dị m. Maka afụọma Gị. Maka ngọzi Gị, Nna. Maka nchedo Gị, e nyem Gị ekele nke si n'obi m pụta. Maka amara Gị. Maka ịdị mma Gị n'isi mu oh. Maka obi ọma Gị, e nyem Gị ekele nke si n'obi m pụta. VERSE 1 A na m ajụzi onwe m "Ọ bụdị sọ m ka Ọ naecheta?" Lekenenu ahụ mu oh! Ahụ m bụ sọ ngọzi Chukwu. Lekenenu isi mu oh! Ọ bụ amara Chukwu dị n'isi mu oh! Gwazienụ m ihe gaeme ka m ghara inye Ya ekele nke ruru Ya. VERSE 2 Leenụ m ka m rahụrụ tetawa ụra n'ahụ ike. Leenụ, ihem kụrụ n'ubi naemezin ke ọma. N'ebem naarụ ọrụ, ọ gịnị ka ị gaaahụ? Na ihe naagara m werewere bụ amara Chineke. Nwannem, gwazienụ m ihe gaeme ka m ghara inye Ya ekele nke ruru Ya. VERSE 3 Nna, ka m jabanụ Gị mma. Ka m nye aha Gị otito. Ka m gọzie aha Gị di elu; Ị bụ Chi mu oh, ezi Chukwu! Ka m gbabaranụ Gị egwu. Ka m kụbaranụ Gị egwu. Ka m tuonụ Gị aha nke kwesịrị Gị, Chukwu o SOLO ENTRY (MALE) + TUTTI Ọ bụ Dike. Ọ bụ Eze. Ọ bụ Odogwu. Tuo Ya Ebubedike doo! Isi iyi nke ndụ mu oh! Oke mmiri naegbu ogwe! Nkenke enyi nke naachụ igwe enyi ọsọ! Chukwu, biko nara! Nara ekelem jiri bịa; nara otitom jiri bịa, iji gosi Gị ka obi dị m n'ihe ọma Ị naemere mu oh. CODA Ezi si n'obi m pụta. Nara ya, gọzie ya, naagọzikwa anyị, Nna doo!

Download the sheet music

KA M BULIE GI ELU

KA M BULIE GI ELU

By Nworie Collins Ifejika
Staff & Solfa
Igbo
34 pages
2 Downloads
FILM 2025 FILM Songs Entrance songs Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want