Jesu, Onye Mmeri ebiliwo by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Easter Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Alleluia obiliwo Jesu abiliwo n'ọnwụ Jesu Onye mmeri Alleluia O! Jesu abiliwo Jesu kpọgburu n'elu obe O! [VERSE 1] N'ụz'ụtụtụ ka ụmụnwanyị jere n'ili ite ude n'ahụ Jesu Mmụọma si n'igwe gbadala n'ili si ha na abiliwo. [VERSE 2] Mary n'ebe akwa naachọ ahụ Jesu Mary n'etim kpu n'ili Jesu Mary naakụgharị ebe n'iri Jesu mgbe ozutere Dinwenu Mary emetụkwanam aka n'ihi na akarom wee jekwu Nnam gabazia gwa ụmụazụ m Ka ha gaba na Galilee Ebe ahụ ka m gaanọ gosi h'onwem n'uju. [VERSE 3] Alleluia Onye mmeri ebiliwo Tobenu Chineke ọ bụ Dike n'agha Dike na dimkpa Odogwu akataka O meriri ekwensu O meriri ike ọnwụ Mary ahụgo ya Peter anụgo ya Thomas ekwelugo Ndị ụmụozi hụrụ ya Ndị mmụọzi naekwe K'anyị ṅụrịbanụ.

Download the sheet music

Jesu, Onye Mmeri ebiliwo

Jesu, Onye Mmeri ebiliwo

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
3 pages
1 Downloads
Easter Hymns
0 0

More lyrics you may want