Full Lyrics
CHORUS
Jesu nọ n'oriri nsọ, bịa were ọnọdụ n'ime m,
site n'achịcha na mmanya a gọziri n'ọlta.
Jesu nọ n'oriri nsọ, ị hụrụ m n'anya
ma n'ime adị m asọ mụ.
Biko Nwa atụrụ, bata n'ime m k'anyị biri.
A nam arịọ gị biko bata.
A nam arịọ gị gị gbaghara
na ifere onwe m n'emezi m,
mak'ifi omume na njọ m o.
A nam arịọ gị biko Nna m o.
A nam arịọ gị gị bịa were ọnọdụ n'ime m,
site n'achịcha na mmanya a gọziri n'ọlta gị.
VERSE 1
Ọkwa Jesu nke Mary mụrụ mmadụ anyị kpọgburu n'obe?
Ọkwa ọ nabatara ọnwụ ahụ ọnwụ afụfụ, maka njọ anyị?
Ọkwa ahụ n'ọbara ya bụ achịcha na mmanya nri mkpụrụ obi?
E kwesịrọ m k'ị bata n'ime m
ma n'ofu okwu gị gaazọ obi mụ o biko...
VERSE 2
Ọkwa kwamgbe kwamgbe m naadapụ n'okwukwe...
Ọkwa kwamgbe kwamgbe anụ arụ m a naemeri...
Ọkwa kwamgbe kwamgbe m naarịọ gị mgbaghara...
Ọkwa kwamgbe kwamgbe m naanachi na njọ... ma n'omume ọzọ.
Ọkwa ahụ n'ọbara ya bụ achịcha na mmanya nri mkpụrụ obi?
E kwesịrọ m k'ị bata n'ime m
ma n'ofu okwu gị gaazọ obi mụ o biko biko...
VERSE 3
A maara m n'emejọrọ m gị.
A maara m n'echefugọ m gị.
A maara m na amaara m ụma mee njọ ugboro ugboro;
ihi i ji maka ya nwụọ.
Mana a chọrọ m ịnachizi na ya.
A chọrọ m ịnaagbawa gị obi.
Gbaghara m o gbaghara m a nam arịọ gị.
Ọkwa ahụ n'ọbara ya bụ achịcha na mmanya nri mkpụrụ obi?
E kwesịrọ m k'ị bata n'ime m
ma n'ofu okwu gị gaazọ obi mụ o biko biko biko...