Full Lyrics
REFRAIN
Nabata Nwaodibo Gị n'alaeze gị.
Gosi ya ebere n'ikpe ị gaekpe ya.
RESPONSE
Anyị arịọ gị Oh Dinwenu.
VERSE 1
K'anyị rịọ arịrịọ maka ndị niile kwerenụ;
ka ha naebi dịka ndị enyi Chineke
nata ngọzi Ya.
VERSE 2
K'anyị rịọ arịrịọ maka ndị nọ n'ahụhụ
n'ihi egwu na ekweghịekwe:
ka udo bata n'obi ha.
VERSE 3
K'anyị rịọ arịrịọ maka ndị nwụrụ
n'ike agha nke obodo:
ka ha nweta udo nke alaeze eluigwe.
VERSE 4
K'anyị rịọ arịrịọ maka ndị nọ n'ahụhụ maka ọnwụ mberede
nke nwanne maọbụ nwa nna ha:
ka ha nweta ntasi obi site na ọchịchị Christi.
VERSE 5
K'anyị rịọ arịrịọ maka "Donatus Ogochukwu Obasi":
ka enweta ndụ zuruoke nke ọ natara mbụ na mmirichukwu,
bịa soro ndị Nsọ naanụrị ebebe.
VERSE 6
K'anyị rịọ arịrịọ maka anyị niile gbakọtara n'ebe a:
ka anyị niile zụkọtakwa otu ụbọchị
n'alaeze nke Ya dị otito.