Nabata Nwaodibo Gi by Nworie Collins Ifejika — Lyrics

Nworie Collins Ifejika Igbo Burial / Funeral Hymns Prayer Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Nabata Nwaodibo Gị n'alaeze gị. Gosi ya ebere n'ikpe ị gaekpe ya. RESPONSE Anyị arịọ gị Oh Dinwenu. VERSE 1 K'anyị rịọ arịrịọ maka ndị niile kwerenụ; ka ha naebi dịka ndị enyi Chineke nata ngọzi Ya. VERSE 2 K'anyị rịọ arịrịọ maka ndị nọ n'ahụhụ n'ihi egwu na ekweghịekwe: ka udo bata n'obi ha. VERSE 3 K'anyị rịọ arịrịọ maka ndị nwụrụ n'ike agha nke obodo: ka ha nweta udo nke alaeze eluigwe. VERSE 4 K'anyị rịọ arịrịọ maka ndị nọ n'ahụhụ maka ọnwụ mberede nke nwanne maọbụ nwa nna ha: ka ha nweta ntasi obi site na ọchịchị Christi. VERSE 5 K'anyị rịọ arịrịọ maka "Donatus Ogochukwu Obasi": ka enweta ndụ zuruoke nke ọ natara mbụ na mmirichukwu, bịa soro ndị Nsọ naanụrị ebebe. VERSE 6 K'anyị rịọ arịrịọ maka anyị niile gbakọtara n'ebe a: ka anyị niile zụkọtakwa otu ụbọchị n'alaeze nke Ya dị otito.

Download the sheet music

Nabata Nwaodibo Gi

Nabata Nwaodibo Gi

By Nworie Collins Ifejika
Solfa
Igbo
2 pages
6 Downloads
Burial / Funeral Hymns Prayer
0 0

More lyrics you may want