Full Lyrics
PART A
Ngwanụ ụmụnne m, tima nụ m kpuọ nụ
Tishie y'ike sh'onye nọ ne titiu nụ wụ Onye ri nsọ nke Izrel.
PART B
K'anyị je kọọrọ ha; je kọọrọ ndị niile n'ata ahụhụ n'ime njọ
Ha shịa mụ m'onye a mụma Aịzaya buru emezuola
Sha kwa ya kururu shi nwa gbọghọ na manwoke ga atụrụ ime mụọ r'ụwa nwa
Bịa lema Imanuel
Gbamavụ kụma mgbirigb' ekeresimesi o
Kụma mgbirigb' ekeresimesi sha
SOPRANO SOLO
Vejin Maria mụọ rala anyị nwa wụ Eze ụwa niile Imanuel
Gama n'ugwu shi sha Maria mụọ rala anyị nwa
Nwa ka nwa Imanuel
Jesu abịala
Eze Nwa ka nwa Imanuel
PART C
Bịanụ k'anyị jema na Betlehem
K'anyị je ma nụ na Betlehem
Ebea mụrụ Nwa ka nwa
Shị anyị je le a nụ nụ Eze Jesu
Dinwenu ji kere kọọrọ mue bọ na kpọ k'anyị jema nụ na Betlehem
K'anyị je kpọ ishi ala
Eze bube dike k'ọ bụ
Omea Nna ya, O yiri Nna ya
Jesu Imanuel
Ụmụ'wa bịama lema nụ o
Sh'ụna hụla kpọ bashi bi n'igwe ji dzie r'anyị Ọpara Ya
N'edzie ụmụnne m sh'ọ ga dịrịla anyị mma
Amen
PART D
K'anyị weje renu y'ọlaedo, frankinsensi na mee
Kụma mgbirigb' ekeresimesi
Sh'ọhụsọ onye ma mma
Kwunụ shi nụ shia h'ọma ma mma
Kpọọ nụ Ya Imanuel