Full Lyrics
REFRAIN
Ihere agaghị eme ndị tụkwasịrị obi ha na gị o Dinwenu.
VERSE 1
Chineke chete ebere gị
na ịhụnanya nke ịgosiri anyị
bido na mgbe ochie
n'ime ịhụnanya gị, cheta m
maka na ị dị mma
Oke o Chineke.
VERSE 2
Wezuga ihe ahụhụ nile
nke obi m zọpụtakwa m
n'nsogbu m nile
lekwasị anya gị n'mmegbu
na ahụhụ nke m naata
ma kpochapụ njọ m nile.
VERSE 3
Zọpụta m ma chekwaba ndụ m
ọ bụ gị bụ onye inye aka m
na ebe mgbaba m, ekwela
ka ihere mee m
Ka ịkwụba aka ọtọ na ịdị asọ
kpuchigide m maka na nchekwube m
dị na gị.