IHE OMA CHINEKE NNA MERE M by Jude Amaechi — Lyrics

Jude Amaechi Igbo Offertory Hymns Hymns Celebrations Solfa notation

Full Lyrics

INTRO / A CAPELLA Lekene ihe ọma Chineke Nna mere mo Olu ebube Chineke mo Kedu ihe m g'enye ya ka o zuo afọma ya REFRAIN A ga m eji aṅụrị ga n'ihu Chineke le Ya n'ọ bụ onye ọma Aga m ebunye ya onyinye Onyinye si n'obi m mo Ji sọpụrụ ya n'ọ bụ Chineke mo VERSE 1 Mgbe mu nọ n'ọrịa Chineke Nna letara mo Ọ kulitere mo n'ute ọrịa mo Ekele dịrị Dinwenụ m VERSE 2 Mgbe ihe n'esiri m ike akpọkuru m ya Dinwenụ m chetara mo Were zọpụta mo VERSE 3 Onyinye ọbịọma ka i jiri bịa n'ihu Chineke Site n'ihe ọ nyere anyị Ka anyị jiri atụrụ ya mma mma VERSE 4 Bute onyinye dị mma bunyenu Chineke K'anyị nye ya onyinye dị mma Ọ gọzikwa anyị

Download the sheet music

IHE OMA CHINEKE NNA MERE M

IHE OMA CHINEKE NNA MERE M

By Jude Amaechi
Solfa
Igbo
2 pages
1 Downloads
Offertory Hymns Hymns Celebrations
0 0

More lyrics you may want