Full Lyrics
INTRO / A CAPELLA
Lekene ihe ọma Chineke Nna mere mo
Olu ebube Chineke mo
Kedu ihe m g'enye ya ka o zuo afọma ya
REFRAIN
A ga m eji aṅụrị ga n'ihu Chineke le
Ya n'ọ bụ onye ọma
Aga m ebunye ya onyinye
Onyinye si n'obi m mo
Ji sọpụrụ ya n'ọ bụ Chineke mo
VERSE 1
Mgbe mu nọ n'ọrịa Chineke Nna letara mo
Ọ kulitere mo n'ute ọrịa mo
Ekele dịrị Dinwenụ m
VERSE 2
Mgbe ihe n'esiri m ike akpọkuru m ya
Dinwenụ m chetara mo
Were zọpụta mo
VERSE 3
Onyinye ọbịọma ka i jiri bịa n'ihu Chineke
Site n'ihe ọ nyere anyị
Ka anyị jiri atụrụ ya mma mma
VERSE 4
Bute onyinye dị mma bunyenu Chineke
K'anyị nye ya onyinye dị mma
Ọ gọzikwa anyị