GORIBENU by Izu Marcel Onyeocha — Lyrics

Izu Marcel Onyeocha Igbo Easter Hymns Holy Week Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

Ike nile nke eligwe ṅụrịwanụ! Igwe ndị mmụma nile kwebe n'ọkwe! Goriwenụ, ihe ekike nile nụrubere ukpu eze Chineke! Jesu Kristi Eze anyị ebilitego! Gbubenụ opi nke nzọpụta. Ụwa, ṅụrịa n'ebili gị n'amụke amụke, were ihe nke onye Eze gị chawapụta! Kristi emerigo! Ebebe ejupụtala n'ime gị Ọchịchịrị enwekwughị ọnọdụ n'ụwa! Nne dị asọ bụ Ụka ṅụrịwa, Na egoli n'otito. Nyabụ Onye Nzọpụta nụ bilitere wụnwụ n'achakwasị gị! Ka'ebe a nile jupụta na ụzụ aṅụrị, na azaghachi ụnụkwu abụ ndị nke Chineke nile! Ndị enyịm ọma, mụ na ha guzo n'ihe a dị asọ soronụ m n'ịrịọ Chineke ebere ka O nye nwaodibo ya na ekwesịghị ekwesị grasia iji kwee ukwe'Gị nke Paska Ya. V: Onyenwe'anyị nọnyere'ụnụ. R: Nọnyerekwa gị. V: Welite nụ'obi ụnụ. R: Anyị'ewelite ha n'ebe Dinwenụ nọ. V: K'anyị nyenụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele. R: Okwesirị bụrịkwa ihe ziri ezi. O kwesirị'nnọ k'anyị were'obi'anyị nile mkpụrụ'obi'anyị nile na olu anyị nile na eto Chineke na'anaghị ahụ'anya, Nna ji ike nile, na sọ otu Nwa ya Dinwenụ'anyị Jesu Kristi. Maka na Kristi ejirila ọbara ya gbata anyị kwụchitere anyị ụgwọ njọ Adam n'aka Nna dị ụwatụwa. Ihe a bụ emume ngafega anyị, mgbe e ji egbu Kristi ezigbo Nwatụrụ nke ọbara ya na edo ụlọ ndị nile kwerenụ asọ. Ihe a bụ'uchichi nụ mgbe ị zọpụtasịrị Nna'anyị ha Isiri n'abụmohu Ijipt duru ha, ụkwụ kọrọ kọrọ ha kufee osịmiri. Ihe a bụ'uchichi nụ mgbe ide ọkụ kpọsara ọchịchịrị nke njọ. Ihe a bụ anyasị nụ, mgbe a na aghọchapụ njọ ndị atụ Kristi nọ n'ebe nile, zọpụta ha na mmetọ nile, kpọbatakwa ha n'ọkwa grasia.

Download the sheet music

GORIBENU

GORIBENU

By Izu Marcel Onyeocha
Staff & Solfa
Igbo
2 pages
1 Downloads
Easter Hymns Holy Week Hymns
0 0

More lyrics you may want