GORIBENU by Izu Marcel Onyeocha — Lyrics

Izu Marcel Onyeocha Igbo Easter Hymns Holy Week Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

Ike nile nke eligwe ṅụrịwanụ! Igwe ndị mmụozi nile kwebenu'ụkwe! Goribenu, ihe ekike nile nọruhere ukpu eze Chineke! Jesu Kristi Eze anyị ebilitego! Gbulienụ opi nke nzọpụta. Ụwa, ṅụrịa aṅụrị k'ị n'amuke amuke, were ihe nke onye Eze gị chawapụta! Kristi emerigo! Ebube ejupụta n'ime gị. Ọchịchịrị enwekwaghị ọnọdụ n'ụwa! Nne dị asọ bụ Ụka ṅụrịwa, Na egoli n'ofufe. Nyahụ Onye Nzọpụta nụ hilitere n'ọnwụ n'achakwasị gị! Ka'ebe a nile jupụta n'ụzọ aṅụrị, na azaghachi nnukwu abụ ndị nke Chineke nile! Ndị enyịm ọma, mụ na ha guzọ n'ihe a dị asọ soronụ m n'ịrịọ Chineke ebere ka Onye nwaodibo ya naekwesịghị ekwesị gwa anyị ji kwee n'ụkwe'a n'ụbọchị Paska Ya. V: Onyenwe'anyị nọnyere'ụnụ. R: Nọnyerekwa gị. V: Welite nụ'obi ụnụ. R: Anyị'ewelite ha n'ebe Dinwenụ nọ. V: K'anyị nyenụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele. R: Okwesịrị buru kwa ihe ziri ezi. O kwesịrị n'ụnọ k'anyị we'r'obi'anyị nile mkpụrụ'obi'anyị nile na olu anyị nile waeto Chineke na'anaghị ahụ'anya, Nna ji ike nile, na sọ olu Nwa ya Dinwenụ'anyị Jesu Kristi. Maka na Kristi ejirila ọbara ya gbata anyị kwụchitere anyị ụgwọ njọ Adam n'aka Nna dị ụwatụwa. Ihe a bụ emume ngafega anyị, mgbe e ji egbu Kristi ezigbo Nwa(ụrụ) nke ọbara ya naedo ụlọ ndị nile kwerenụ asọ. Ihe a bụ'ụchịchị nụ mgbe ị zọpụtasịrị Nna'anyị ha isiri n'abụmn'ohu tụhapụ ụmụ Isrel duru ha, ụkwụ kọrọ kọrọ ha kufee osimiri. Ihe a bụ'ụchịchị nụ mgbe idenụ kụpọsara ọchịchịrị nke njọ. Ihe a bụ anyasị nụ, mgbe a naaghọchụpụ ajọ ụdị a nụ Kristi nọ n'ebe nile, zọpụta ha na mmetọ nile, kpụbatakwa ha n'ọkwa grasia ọnọdụ ha na abawanye n'adịm asọ. Ihe a bụ'ụchịchị nụ, mgbe Jesu Kristi dọbiri ụdọ igwe nke ọnwụ si n'ili hilite n'ebube. Gịnị bụ uru ndụ gaara ịbara'anyị ma a sị na Kristi abịaghị bụrụ onye nzọpụta anyị. Nna, anya ị naeleta anyị adịkakwanụ egwu! Ka nnukwu amara gị si karịa nchịkọta na ọjị maka ị jị gbapụta nwaohu ka i jiri hanye Nwa Gị. O mmehie ihụ ọma njọ dị mkpa nụ Adam mehiere, nke rịtere anyị nnukwu onye'mgbapụta dị ntu a! Ụchịchị dị ngọzị kụrịcha ihe ya, Chineke hụrụ ya ịhụ na Kristi si na'ndị nwụrụ'anwụ naekulite! Akwụkwọ'nsọ kwuru banyere ụchịchị a sị: "Ụchịchị gaefo dịka chiị Ọ gaabụ ihe m na aṅụ m." Ike nke ụchịchị a d'asọ n'achụsasị ajọ ihe nile naasachapụ ọta'mmehie, naeweghachite amaghị aghụghọ, naewetara ndị nọ n'ụrụ aṅụrị; ọ naewepụ akpọmasị, na ewetara anyị udo, na emeda ngala nke ụwa a. Ọ bụ ụchịchị a gọziri'nụ'ọ n'ezie mgbe eligwe na ala jikọrọ akagbaa akwụkwọ, a bjakwa duzie agbata Chineke na mmadụ. Ya bụ, Nna'nke eligwe, n'ime aṅụrị nke ụchịchị a, nabata aja ntito anyị na ehunyere gị n'anyasị a, ọ bụ onyinye pụrụ iche nke Ụka Gị. Nara ọkụ Pascha nke a, ọbụ ire'ọkụ kewara ekewa mana ọ danyụghị adanyụ, ọ bụ ide ọkụ n'ebike na nsọpụrụ'nke Chineke Ka ya na ọkụ nke eligwe gbagwaa n'ewu n'ike n'ike, Kpasasị ọchịchịrị nke ụchịchị a! Ka kpakpando Ụtụtụ hụ enweghị ọdịda kwụdọ ire'ọkụ a ka ọ naenwu: Kpakpando Ụtụtụ ahụ bụ Kristi, onye siri na'ndị nwụrụ'anwụ pụtakwa ọzọ bịakwa chakwasị ụwa nile ihe udo ya, Nwa gị Onye nọ adị naachị ebe ebe ebelie. Amen.

Download the sheet music

GORIBENU

GORIBENU

By Izu Marcel Onyeocha
Staff & Solfa
Igbo
4 pages
1 Downloads
Easter Hymns Holy Week Hymns
0 0

More lyrics you may want