Full Lyrics
CHORUS
Gị bụ Onye nchedo anyị, Chineke m o,
Site na ndụ duga ndụ, ruo na ndụ duga ndụ.
VERSE 1
Ị n'emegharị mmadụ ka ọ bụrụ ntụ,
Ị bịakwa sị ụmụ mmadụ lachịghanu azụ.
N'ihi na puku afọ n'ihu Gị dịka ụnyahụ gaaaga,
Dịka nche abalị.
REFRAIN
Oh Chi m o, Onye nche anyị mgbe dum.
VERSE 2
Ị nasachapụ ndụ mmadụ dịka nrọ,
Dịka ahịhịa n'epulite n'ụtụtụ.
N'ụtụtụ ọ pụa mịa ifuru,
Ma na mgbede ọ kpọnwụọ bịa nwụchasịa.
VERSE 3
Mee ka m ji mata etu ndụ anyị si dị nkenke,
Ka m ji wee nweta amamihe n'obi anyị.
Iwe Gị ọ gaadịgide ebeebe?
Onyenweanyị ka m nụ nụ.
Gosenu nwodibo Gị ebere Gị.
VERSE 4
Na chi ọbụbọ mee ka m ji juputa n'ịhụnanya Gị,
Anyị gaeñụrịkwa n'ụbọchị ndụ anyị niile ka ị hụ ọma.
Selili Onyenweanyị dị n'ebe anyị,
Ka m ji wee nyekwa aka ọrụ Gị ọ gaa n'ihu.