Full Lyrics
VERSE 1
Echesiara mo, Ihe ọma Chineke na eme na ndụ mo
mgbu'ikpere n'ala chiliere y'aka elu.
Mbur'ukpo ekele we r'ọsọ gaba mak'echiete ka,
Chi mu dị mma Ọ dị r'obi mụ mma.
CHORUS
Chineke Ị dị mma, Ị dị mma, O Chineke
Ị dị mma o, Ị dị r'obi mo. Ọrụ aka Gị mara mma,
Chi ọma n'Ikesịar'ọgwụ, Ị dị mma, Ị dị mma, Ị dị mma, ony'ọma.
Nd'ikere eke abịaruo la, anyị jiukwe n'abụ otito bịa,
k'anyị bu lie Gị elu jaa Gị mma eeh Chimma.
Mgbọrọgwụ David Chukwu, Gị onye ji nkata echu mmiri k'ihe remee ndi ji ite bịa omeihewukwu ai.
Mgbọrọgwụ David Chukwu, nkenke ịghi na ebu ogbe, ihe imere asogbuo mo Ị dị mma Chim.
Mgbọrọgwụ David Chukwu, Chim kpọr'okwu Ọzaa zaa mụ karịa kam si rịo aka mụ dị n'elu.
I mela I mela, merem' jietu Gị omen'ụkọ, Ị dị mma Ị dị mma, Ị dị r'obi mụ mma.
OSTINATO
eeh! Ị dị mma (ne zie) Ị dị mma (ne zie)
Ị dị mma, Ị dị r'obi mụ mma.
VERSE 2
Eze ndi eze, ndi eze na ez'eze ọkaka, ebe mgbaba mo,
agam'e so gị de Gị ru'ebighiebi o.
Na rụ ekele, ugwu n'ijamma Chi mu riwe otito ruru Gị,
Ị dị mma, Ị dị r'obi mụ mma.