Full Lyrics
CHORUS
Ị bụ ụkọchukwu ebighị ebi
N'usoro nke Melkizedek.
VERSE 1
Onyenweanyị gwara nna m ukwu
Nọdụ ala n'aka nri mu
Wee ruo mgbe m mere ka ndị iro gị
Buru ihe mgbakwasị ụkwụ.
VERSE 2
Onyenweanyị gaesi na Zayọn
Sepụta mkpara eze i ji em'ọgụ
Chịba, chịba ọchịchị
N'etiti ndị iro gị.
VERSE 3
Site n'ụbọchị amụrụ gị n'ebube nsọ
Ị bụ nwa eze
Amụputara m gị dị ka igirigi ụtụtụ
Tupu chi ọbụbọ.
VERSE 4
Onyenweanyị aṅụọla iyi
A dighị agha ya
Ị bụ ụkọchukwu ebighị ebi
N'usoro nke Melkizedek.