Full Lyrics
REFRAIN
Tobe Chukwu Nna,
Nna na Nwa na Mụọ Nsọ n'ụwatụwa.
VERSE 1
K'anyị bịa soro Kristi,
Runyere Chukwu aja Mass.
VERSE 2
Ọ bụ aja nke Calvary,
K'Ojiri wee gbapụ'anyị.
VERSE 3
Si na mbọsị Baptisma,
K'anyị debe iwu Chukwu.
VERSE 4
Sekpue kpọ njọ gị asị,
N'iru Nna rịọ Ya ebere.
VERSE 5
Wer'obi dị umeala,
Kele Nna rịọ Ya mkpa gị.
VERSE 6
Wer'obi nụrị nye Nna,
Otito mbọsị ndụ gị.
VERSE 7
'tito dịrị Chukwu Nna,
Chukwu Nwa, Chukwu Mụọnsọ.
VERSE 8
Etu ọdịrị na izizi,
Dịkwa kịta g'adị ebebe.