Ezi Chukwu Nara Aja Anyi by Obieli Udoka — Lyrics

Obieli Udoka Igbo Consecration Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Anyi ario Gi nar'aja anyi Ezi Chukwu nabata ya Were ya gozie ya mekwaa ya Nna K'o dimma kwesi n'ig'a nara ya. VERSE 1 Mgb'anyi nerunyere Gi aja obi oma anyi Nke bu ihe ala miputara O bughi nkwughachi ihunanya Gi Anyi enwegh'ike ya. VERSE 2 Mgb'obul'anyi bumu Gi gbakoro n'iru Gi I churu Gi aja kasiaso K'anyi nerunye ya maka ndi mmadu nile Ndi di ndu na ndi nwur'anwu. VERSE 3 So Ngi bu ndu ndi kwere na Gi Ndu ihe nile n'uwa na n'eligwe Gosianyi uzo nke ka mma Iji wee gosi Gi anuria anyi na Gi. VERSE 4 Ndi nso n'eji ukwe anuri Eto afoma Gi n'eto kw'ike Gi Kwere k'anyi soro ha too Gi Oge nile site n'aja anyi. VERSE 5 Gozie anyi, gozie anyi, gozie, O Chukwu anyi, ndi n'achuru Gi aja Nar'anyi, nar'anyi, nara, O Chukwu anyi, aja nke onwe anyi.

Download the sheet music

Ezi Chukwu Nara Aja Anyi

Ezi Chukwu Nara Aja Anyi

By Obieli Udoka
Solfa
Igbo
2 pages
121 Downloads
Consecration Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want