EZI CHUKWU NARA AJA ANYI by Obieli Udoka — Lyrics

Obieli Udoka Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Anyị arịọ Gị, nara aja anyị, Ezi Chukwu, Ezi Chukwu. Nabata ya, were ya gozie ya, Mekwaa ya Nna k'ọ dị mma, Kwesi n'ị gaanara ya. VERSE 1 Mgb'anyị n'erunyeere Gị aja obi ọm'anyị, Nke bụ ihe ala mịpụtara. Ọ bụghị nkwụghachi ịhụnanya Gị, Anyị enwegh'ike ya. VERSE 2 Mgb'ọbụl'anyị bụ ụmụ Gị gbakọrọ n'iru Gị, Ịchụrụ Gị aja. Kasịasọ k'anyị n'erunye ya maka ndị mmadụ nile, Ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. VERSE 3 Sọ Ngị bụ ndụ ndị kwere na Gị, Ndụ ihe nile n'ụwa na n'eligwe. Gosi anyị ụzọ nke ka mma, Iji wee gosi Gị aṅụrị anyị na Gị. VERSE 4 Ndị nsọ n'eji ukwe aṅụrị eto afọma Gị, N'eto kw'ike Gị. Kwere k'anyị soro ha too Gị oge nile, Site n'aja anyị. VERSE 5 Gozie anyị, gozie anyị, gozie, O Chukwu anyị, Ndị n'achụrụ Gị aja. Nar'anyị, nara anyị, nara, O Chukwu anyị, Aja nke onwe anyị.

Download the sheet music

EZI CHUKWU NARA AJA ANYI

EZI CHUKWU NARA AJA ANYI

By Obieli Udoka
Solfa
Igbo
3 pages
2 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want