Full Lyrics
CHORUS
Anyị arịọ Gị, nara aja anyị,
Ezi Chukwu, Ezi Chukwu.
Nabata ya, were ya gozie ya,
Mekwaa ya Nna k'ọ dị mma,
Kwesi n'ị gaanara ya.
VERSE 1
Mgb'anyị n'erunyeere Gị aja obi ọm'anyị,
Nke bụ ihe ala mịpụtara.
Ọ bụghị nkwụghachi ịhụnanya Gị,
Anyị enwegh'ike ya.
VERSE 2
Mgb'ọbụl'anyị bụ ụmụ Gị gbakọrọ n'iru Gị,
Ịchụrụ Gị aja.
Kasịasọ k'anyị n'erunye ya maka ndị mmadụ nile,
Ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.
VERSE 3
Sọ Ngị bụ ndụ ndị kwere na Gị,
Ndụ ihe nile n'ụwa na n'eligwe.
Gosi anyị ụzọ nke ka mma,
Iji wee gosi Gị aṅụrị anyị na Gị.
VERSE 4
Ndị nsọ n'eji ukwe aṅụrị eto afọma Gị,
N'eto kw'ike Gị.
Kwere k'anyị soro ha too Gị oge nile,
Site n'aja anyị.
VERSE 5
Gozie anyị, gozie anyị, gozie, O Chukwu anyị,
Ndị n'achụrụ Gị aja.
Nar'anyị, nara anyị, nara, O Chukwu anyị,
Aja nke onwe anyị.