Full Lyrics
CHORUS
Anyị arịọ gị nara aja anyị
Ezi Chukwu, Ezi Chukwu
Nabata ya were ya gọzie ya
Nna k'ọ dị mma kwesị n'ị gaanara ya.
VERSE 1
Mgbe anyị naehunyere gị aja
Obi ọma anyị nke bụ ịhụnanya
Taa mịpụta taa
Ọ bụghị nkwughachi
Ịhụnanya gị anyị enweghị ike ya.
VERSE 2
Mgbe bụla anyị bụ ụmụ gị
Gbakọrọ n'ihu gị ịchụrụ
Gị aja kacha nsọ
Ka anyị naerunye ya maka ndị mmadụ niile
Ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.
VERSE 3
Sọ gị bụ ndụ ndị kwere
N'eji ndụ ihe niile n'ụwa
Ma n'eluigwe
Gosi anyị ụzọ nke ka mma ije
Wee gosi gị aṅụrị anyị na gị.
VERSE 4
Ndị nsọ naejukwa aṅụrị
Naeto afọma gị naeto ike gị
Kwere ka anyị soro ha too gị
Oge niile site n'aja anyị.
VERSE 5
Gọzie anyị, gọzie anyị, gọzie, O Chukwu anyị
Ndị naachụrụ gị aja
Nara anyị, nara anyị, nara, O Chukwu anyị
Aja nke onwe anyị.