Ezi Chukwu Nara Aja Anyi by Obieli Udoka — Lyrics

Obieli Udoka Igbo Offertory Hymns Consecration Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Anyị arịọ gị nara aja anyị Ezi Chukwu, Ezi Chukwu Nabata ya were ya gọzie ya Nna k'ọ dị mma kwesị n'ị gaanara ya. VERSE 1 Mgbe anyị naehunyere gị aja Obi ọma anyị nke bụ ịhụnanya Taa mịpụta taa Ọ bụghị nkwughachi Ịhụnanya gị anyị enweghị ike ya. VERSE 2 Mgbe bụla anyị bụ ụmụ gị Gbakọrọ n'ihu gị ịchụrụ Gị aja kacha nsọ Ka anyị naerunye ya maka ndị mmadụ niile Ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. VERSE 3 Sọ gị bụ ndụ ndị kwere N'eji ndụ ihe niile n'ụwa Ma n'eluigwe Gosi anyị ụzọ nke ka mma ije Wee gosi gị aṅụrị anyị na gị. VERSE 4 Ndị nsọ naejukwa aṅụrị Naeto afọma gị naeto ike gị Kwere ka anyị soro ha too gị Oge niile site n'aja anyị. VERSE 5 Gọzie anyị, gọzie anyị, gọzie, O Chukwu anyị Ndị naachụrụ gị aja Nara anyị, nara anyị, nara, O Chukwu anyị Aja nke onwe anyị.

Download the sheet music

Ezi Chukwu Nara Aja Anyi

Ezi Chukwu Nara Aja Anyi

By Obieli Udoka
Solfa
Igbo
2 pages
18 Downloads
Offertory Hymns Consecration Hymns
1 0

More lyrics you may want