Full Lyrics
REFRAIN
Anyị arịọ Gị nara aja anyị, Ezi Chukwu nabata ya,
Were ya gọzie ya makwaa ya Nna, k'ọ dị mma k'i si n'ị ganara ya.
VERSE 1
Mgb'anyị n'erunye Gị aja obi ọm'anyị nke bụ ihe ala mịpụtara,
Ọ bụghị nk'ọghachi ịhụnanya Gị anyị enwegh'ike ya.
VERSE 2
Mgb'ọbụ l'anyị bụ ụmụ Gị gbakọrọ n'iru Gị ịchụrụ Gị aja ka si nsọ,
K'anyị n'erunye ya maka ndị mmadụ niile ndị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.
VERSE 3
Sọ Gị bụ ndụ ndị kwere na Gị ndụ ihe niile n'ụwa na n'elu igwe,
Gosi anyị ụzọ nke ka mma iji wee gosi Gị aṅụrị anyị na Gị.
VERSE 4
Ndị nsọ n'eji ukwe aṅụrị eto afọma Gị n'etokw'ike Gị,
Kwere k'anyị soro ha too Gị oge niile site n'aja anyị.