Full Lyrics
REFRAIN
Anyị arịọ Gị nara aja anyị,
Ezi Chukwu nabata ya,
Were ya gọzie ya, makwaa ya mma,
Kwesị n'ị gaanara ya.
VERSE 1
Mgb'anyị naerunyeere Gị aja,
Obi ọma anyị nke bụ ihe ala mịpụtara.
Ọ bụghị nk'ọghachi,
Ịhụnanya Gị anyị enwegh'ike ya.
VERSE 2
Mgb'ọbụl'anyị b'ụmụ aị gbakọrọ n'iru Gị,
Ịchụrụ Gị aja kachasị nsọ.
K'anyị naerunye ya maka ndị mmadụ nile,
Ndị dị ndụ na ndị nwụr'anwụ.
VERSE 3
Sọ Gị bụ ndụ ndị kwere na Gị,
Ndụ ihe nile n'ụwa na n'elu igwe.
Gosi anyị ụzọ nke ka mma,
Iji wee gosi Gị aṅụrị anyị na Gị.
VERSE 4
Ndị nsọ n'eji ukwe aṅụrị,
Eto afọma Gị n'etokw'ike Gị.
Kwere k'anyị soro ha too Gị,
Oge nile site n'aja anyị.