Ezi Chukwu Nara Aja Anyi by Obielu Udoka — Lyrics

Obielu Udoka Igbo Offertory Hymns Hymns Sacred songs Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Anyị arịọ Gị nara aja anyị, Ezi Chukwu nabata ya, Were ya gọzie ya, makwaa ya mma, Kwesị n'ị gaanara ya. VERSE 1 Mgb'anyị naerunyeere Gị aja, Obi ọma anyị nke bụ ihe ala mịpụtara. Ọ bụghị nk'ọghachi, Ịhụnanya Gị anyị enwegh'ike ya. VERSE 2 Mgb'ọbụl'anyị b'ụmụ aị gbakọrọ n'iru Gị, Ịchụrụ Gị aja kachasị nsọ. K'anyị naerunye ya maka ndị mmadụ nile, Ndị dị ndụ na ndị nwụr'anwụ. VERSE 3 Sọ Gị bụ ndụ ndị kwere na Gị, Ndụ ihe nile n'ụwa na n'elu igwe. Gosi anyị ụzọ nke ka mma, Iji wee gosi Gị aṅụrị anyị na Gị. VERSE 4 Ndị nsọ n'eji ukwe aṅụrị, Eto afọma Gị n'etokw'ike Gị. Kwere k'anyị soro ha too Gị, Oge nile site n'aja anyị.

Download the sheet music

Ezi Chukwu Nara Aja Anyi

Ezi Chukwu Nara Aja Anyi

By Obielu Udoka
Solfa
Igbo
1 page
2 Downloads
Offertory Hymns Hymns Sacred songs
0 0

More lyrics you may want