Full Lyrics
Ndi Otu Kristi ndi nwe m k'anyi kwuputanu okwukwe anyi o
Ekwerem n'Otu Chineke A ee Ee a ee Nna ji ike niile
Ndi Otu Kristi o Ndi Otu Kristi
Umu ndi nwe m k'anyi kwuputanu okwukwe anyi o
Ekwerem n'Otu Chineke A ee Ee a ee Nna ji ike niile A ee Ee a ee Ae
Onye mere Eligwe n'ala e
Ihe dum a na ahu anya
Umu Nnaa e
na ndi a na naghi ahu anya
Ya na Otu Onyenweanyi Jesu Kristi dinambido
Ekwerem na Ya o
So Otu Nwa Chineke muru
Nna muru ee tupu uwatuwa niile
Ee ae
Chukwu si na Chukwu
Ihe si n'ihe
Ekwerem na Ya o
Ezi Chukwu si n'Ezi Chukwu,
Amuru amu emeghi eme
Ya na Nna bu Otu ihe n'ihe ha ji buru Chukwu
Ee ae
Onye esi na Ya mee ihe dum
Onye mak'ihi anyi bu mmadu
Onye mak'ihi anyi e
Na mak'ihi nzoputa anyi si n'Eligwe gbadata
O wer' ahu na Virgin Maria site na Muo Nso
O buru mmadu ewo
Ee ae a
A bia kpogbuo Ya n'obe n'ihi anyi n'oge ochichi nke Pontius Pilate, ewo
Umu nnaa e
O taa ahuhu, O nwuo elie Ya o
Ma O bilitere n'ubochi nke ato o
Ekwerem na Ya o
Dika AkwukwoNso si kwuo
O ragoro n'Elugwe noro n'aka nri Nna o
O ga abia ozo o
ma O ga abia ghachi ozo n'ebube Ya
i kpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpe
Ndi Otu Kristi anyi e
Ony'ochichi Ya n'enweghi njedebe
Ekwerem na MuoNso
Onyenweanyi n'enye ndu
Ndi nkweye
Ekwerem na MuoNso
Onye si na Nna na Nwa puta
Onye an'esekpuru n'etokodo Ya na Nna na Nwa
Ekwerem na Ya o
Onye si na ndi Amuma kwuo okwu
Ekwerem n'Otu Nzukwo Nso Katolik na Apostolik
Ee ae
Ekwuputam Otu Baptism nke mgbaghara njo
A na m a tu anya o
mbilite n'onwu
A na m a tu anya mbilite n'onwu ndi nwuru anwu
Na ndu uwa gaabianu o
Amen, Amen.